AKỤKỌ NDỤ
Jehova Emeerela M Ihe Ọma Na-erughịrị M
Mgbe m dị obere, m na-enwe mmasị ime ihe ndị na-eto eto ibe m na-eme, na-echekwa otú m ga-esi bụrụ onye a ma ama. Ọ na-atọ m ụtọ iso ndị enyi m na-anọ. M na-enwekwa mmasị igwu mmiri na ịgba bọl. Ma, o nwere otu ihe dị egwu mere mgbe m dị afọ iri na asaa. Otu ụbọchị, ná mgbede, eji m ọgba tum tum nwee ihe mberede okporo ụzọ nke mere ka ahụ́ m kpọnwụọ, si n’olu ruo n’ụkwụ m. O meela ihe dị ka afọ iri atọ ugbu a. O teekwala m na-anaghịzi enwe ike isi n’àkwà m bilie.
Etoro m n’Alikanti, bụ́ obodo dị n’akụkụ oké osimiri dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Spen. N’ezinụlọ anyị, o nweghị onye na-achọ ịma gbasara ibe ya. Ọ bụ ya mere na mgbe m dị obere, ụkwụ na-anọkarị m n’ámá. E nwere ebe a na-arụzi taya n’akụkụ ụlọ anyị. Mụ na otu n’ime ndị na-arụ ọrụ ebe ahụ bịara bụrụ enyi. Aha ya bụ José María. Ọ naghị eme ka ndị ezinụlọ anyị. Ihe gbasara m na-emetụ ya n’obi. M nwee nsogbu, ọ na-enyere m aka ka ọ̀ bụ otu nne ji mụ na ya. Mụ na ya bụ ezigbo enyi n’agbanyeghị na o ji afọ iri abụọ tọọ m.
N’oge ahụ, José María na Ndịàmà Jehova ebidola ịna-amụ Baịbụl. M hụrụ na o jighị Akwụkwọ Nsọ egwu egwu. Ọ na-akọkwara m ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl. Ya na-akọ, mụ ana-ege ya ntị. Ma, o nweghị mgbe ọ bụla m chebaara ihe ọ na-akọrọ m echiche. Uche m niile dị n’ihe ndị ọzọ n’oge ahụ. Ma, o nwere ihe mere ka uche m mechazie dịrị na ya.
IHE MBEREDE OKPORO ỤZỌ NKE GBANWERE NDỤ M
Anaghị m achọ ịkọ ihe kpatara ihe mberede okporo ụzọ a. Naanị ihe m nwere ike ikwu bụ na ọ bụ nzuzu m na aghara m kpataara m nsogbu a. Ndụ m gbanwere kpamkpam n’otu ụbọchị. Ahụ́ dị m nnọọ gara gara n’ụbọchị ahụ, ma n’otu ntabi anya, ahụ́ m akpọnwụọ, mụ ahụzie onwe m n’ụlọ ọgwụ. Onye gwa m na ọ bụ m ga-anọ n’ute ọrịa a m nọ kemgbe, agaghị m ekweta. M nọ na-ajụ onwe m, sị, ‘M̀ ka nọ ndụ eme gịnị?’
José María bịara leta m n’ụlọ ọgwụ. Ozugbo ahụ kwa, ọ gwara Ndịàmà Jehova nọ n’ọgbakọ dị n’ebe ahụ ka ha na-abịa eleta m. Otú ha si na-abịa eleta m ruru m n’obi. Ozugbo m si na ngalaba ebe a na-elekọta ndị ọrịa ha dị oké njọ pụta, mụ na Ndịàmà Jehova bidoro ịmụ Baịbụl. M ghọtara ihe mere ndị mmadụ ji ata ahụhụ, na-anwụkwa anwụ, na ihe mere Chineke ji kwe ka ihe ọjọọ na-eme. Amụtakwara m na Chineke kwere nkwa ime ka ụmụ mmadụ zuo okè n’ụwa niile, e nweghịzi onye ga-asị: “Ana m arịa ọrịa.” (Aịzaya 33:24) Ọ bụ ugbu a m bidoro mụwa Baịbụl ka m matara na ihe ga-adịrị m mma n’ọdịnihu.
Mgbe m si n’ụlọ ọgwụ lọta, amụsiwere m Baịbụl ike. M na-eji ígwè ndị ngwọrọ a rụrụ otú pụrụ iche agadị ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova mgbe ụfọdụ, sorokwa ha gaa ozi ọma. N’abalị ise n’ọnwa Nọvemba afọ 1988, mgbe m dị afọ iri abụọ, e mere m baptizim n’ime otu nnukwu ihe a na-anọ n’ime ya
asa ahụ́. Jehova Chineke emeela ka m mata na ndụ m dị bara uru. Ma, olee ihe m ga-eme iji gosi Jehova na obi dị m ụtọ n’ihe ọma a o meere m?M NA-EJERE JEHOVA OZI N’AGBANYEGHỊ NA M NWERE NKWARỤ
Ekpebisiri m ike na m gaghị ekwe ka nkwarụ mụ a mee ka m ghara ime ihe m ga-emeli n’ozi Jehova. M chọrọ ịna-aga n’ihu n’ozi Jehova. (1 Timoti 4:15) Ọ dịghịrị m mfe ná mmalite, n’ihi na obi adịghị ndị ezinụlọ anyị mma na m bụzi Onyeàmà Jehova. Ma, ụmụnna m ndị mụ na ha na-efekọ Jehova kwụ m n’azụ. Ha ekweghị ka ọmụmụ ihe ọ bụla kwaa m, ha na-akpọkwa m aga ozi ọma.
Nwayọọ nwayọọ, nsogbu m bịara ka njọ, ya adịzie mkpa ka m nwee onye ga na-elekọta m mgbe ọ bụla. O tere aka tupu a chọta ebe dị mụ mma a na-elekọta ndị nwere nkwarụ n’obodo Valenshia. Ọ dị otu narị kilomita na iri isii ma e si ebe ugwu Alikanti gawa ya. Ebe ahụ ka m bizi ruo taa.
Ọ bụ eziokwu na ọrịa m anaghị ekwe m si n’àkwà m bilie, ekpebisiri m ike ịna-ezi ndị mmadụ ozi ọma
Ọ bụ eziokwu na ọrịa m anaghị ekwe m si n’àkwà m bilie, m kpebisiri ike ịna-efe Jehova na-akwụsịghị akwụsị. Eji m ego mmachi akpa gọọmenti na-enye ndị nwere nkwarụ nakwa ego ndị ọzọ gọọmenti na ndị mmadụ na-enye m zụta kọmputa na ekwentị. E doweere m kọmputa ahụ n’akụkụ àkwà m. Ọ na-abụ chi foo, onye na-elekọta m agbanyere m ya na ekwentị m. E nwere ihe a kwụnyeere m na kọmputa m nke na-eme ka m nwee ike iji agba m na-apị ya. Enwekwara m mkpịsị pụrụ iche m na-eji ọnụ m ejide. M na-eji ya ede ihe m chọrọ ide na kọmputa m na n’ekwentị m, na-ejikwa ya apị nọmba ekwentị ọ bụla m chọrọ ịkpọ.
Olee uru kọmputa na ekwentị mụ a baarala m? Nke mbụ bụ na, m na-eji ha aga n’adres Ịntanet bụ́ jw.org nakwa n’Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET. Ihe ndị dị na ha abaarala m ezigbo uru. Ọtụtụ mgbe, m na-amụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl ruo ọtụtụ awa. O meela ka m na-amụtakwu gbasara Chineke na àgwà ya. Mgbe ọ bụla ọ dị ka owu ọ̀ na-ama m ma ọ bụ na obi ọ̀ chọwala ịjọ m njọ, m na-achọta ihe na-eme ka obi dị mụ mma na jw.org.
Oge ọmụmụ ihe ọgbakọ anyị ruo, m na-eji kọmputa m ege ihe a na-ekwu, aza ajụjụ, edu n’ekpere, akụzi ihe, ma na-agụkwara ọgbakọ Ụlọ Nche ụbọchị e kenyere m ịgụ. N’agbanyeghị na anaghị m agali n’ebe a na-anọ enwe ọmụmụ ihe, m na-eso ọgbakọ eme ihe ndị a na-eme.
Ọ bụ eziokwu na enweghị m ike ịga ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ otú ọtụtụ Ndịàmà Jehova na-eme, m na-eji ekwentị m na kọmputa m ezi ndị ọzọ ozi ọma. Otú m si eji ekwentị ezi ndị mmadụ ozi ọma medịrị ka ndị okenye ọgbakọ anyị gwa m ka m na-ahazi ozi ọma e ji fon ezi n’ọgbakọ anyị. Ụdị ozi ọma a na-eme ka ndị ọgbakọ anyị na-enweghị ike isi n’ụlọ ha pụta nwee ike ịna-ezi ndị mmadụ ozi ọma.
Ma, ọ bụghị naanị ekwentị na kọmputa ka mụ na ha na-anọ mgbe niile. O nweghị ụbọchị ndị enyi m na-anaghị abịa eleta m. Ha na-akpọ ndị ikwu ha na ndị nwere mmasị ịmụ Baịbụl abịa. Ha na-agwakarị m ka m kụziere ndị ahụ ha kpọ bịa Baịbụl. O nwekwara mgbe ezinụlọ ụfọdụ na-abịa ka mụ na ha soro nwee ofufe ezinụlọ. Obi na-akacha atọ m ụtọ ma ụmụaka ha bịa nọdụ n’akụkụ àkwà m na-akọrọ m ihe mere ha ji hụ Jehova n’anya.
Ọtụtụ oge, ụlọ m na-eju na mmadụ. Ndị enyi m na-esi ebe dị iche iche abịa eleta m. Nleta a ha na-eleta m na-atọ m ụtọ. Otú a ndị mmadụ si ekworo abịa eleta m na-eju ndị ụlọ ọgwụ na-elekọta m anya. M na-ekele Jehova kwa ụbọchị na o mere ka m nwee ụdị ụmụnna a na-enweghị atụ.
M KA NỌ NA-ADỌLỊ
Mmadụ kelee m, jụọ m otú m mere, m na-agwa onye ahụ, sị: “M ka nọ ya, na-adọlị.” Ma, ama m na ọ bụghị naanị m na-adọlị. N’agbanyeghị ihe bụ́ nsogbu na-abịara Ndị Kraịst, anyị niile na-alụ “ezi ọgụ nke okwukwe.” (1 Timoti 6:12) Olee ihe nyeere m aka ịna-edi nsogbu a bịaara m kemgbe ọtụtụ afọ? M na-ekpe ekpere kwa ụbọchị, na-ekele Jehova na o mere ka m mata na ndụ m dị bara uru. M na-agbakwa mbọ otú ike kwere m n’ozi m na-ejere Jehova, na-echetakwa na ahụ́ ga-adị mụ mma n’ọdịnihu.
M na-echekarị otú ndụ ga-adị n’ụwa ọhụrụ, mgbe m ga-enwe ike ịgba ọsọ ma na-awụli elu. Enyi m nwoke ahụ bụ́ José María nwekwara nkwarụ n’ihi ọrịa polio. Mgbe ụfọdụ, m chọọ igwusa ya egwu, mụ asị ya: “Mụ na gị gbawa ọsọ n’ụwa ọhụrụ, ònye ga-agbaka ibe ya?” Ya asị m na “ihe dị mkpa abụghị onye ga-agbaka ibe ya, kama, ọ bụ ka anyị banyegodị na Paradaịs.”
Ọ ka na-esiri m ike ikweta na enweghịzi m ike ibili ebili. Ama m na mgbe m ka na-eto eto, m zuzuru nzuzu tinyere m ná nsogbu a m nọ na ya ugbu a. Ma, m na-ekele Jehova na ọ hapụghị m. O meerela m ọtụtụ ihe ọma. O meela ka m nwee ụmụnna mụ na ha so efe ya, ndụ ana-atọ m ụtọ, mụ ana-enwe ọṅụ na m na-akụziri ndị ọzọ ihe, nweekwa olileanya na ahụ́ ga-emecha dị mụ mma. A sị m kwuo otú obi dị m naanị n’otu ahịrịokwu, m ga-asị na Jehova emeerela m ihe ọma na-erughịrị m.