Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Ò nwere mgbe mmadụ na-agaghịzi ada ogbenye n’ụwa a?
N’afọ ọ bụla, ọtụtụ nde ndị ogbenye ọnụ ntụ na-anwụ n’ihi ọrịa na agụụ. Ọ bụ eziokwu na e nwere ebe ụfọdụ n’ụwa anyị a ọtụtụ ndị bara ọgaranya, ma, imirikitimi ndị mmadụ n’ụwa ka bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ. Baịbụl kwuru na e nwere ndị ogbenye kemgbe ụwa.—Gụọ Jọn 12:8.
A ga-enwerịrị otu ọchịchị ga na-achị ụwa niile tupu a gharazie inwe onye dara ogbenye. Ọchịchị ga-eme ya ga-abụrịrị ọchịchị ga-enwe ike ịhụ na akụ̀ ndị dị n’ụwa na-erute ma onye ukwu ma onye nta aka, hụkwa na a kwụsịrị ịlụ agha, bụ́ ihe kacha eme ka ndị mmadụ daa ogbenye. Chineke ekwela nkwa ime ka e nwee ọchịchị ga-eme ihe ndị a n’ụwa.—Gụọ Daniel 2:44.
Ònye ga-emeli ka ndị mmadụ kwụsị ịda ogbenye?
Chineke ahọpụtala Ọkpara ya bụ́ Jizọs ka ọ chịwa ụmụ mmadụ. (Abụ Ọma 2:4-8) Jizọs ga-anapụta ndị ogbenye ma mee ka mmegbu na ime ihe ike kwụsị.—Gụọ Abụ Ọma 72:8, 12-14.
Jizọs, bụ́ “Onyeisi Udo,” ga-eme ka udo dị n’ụwa niile, meekwa ka obi ruo onye ọ bụla ala. Onye ọ bụla nọ́ n’ụwa n’oge ahụ ga-enwe ụlọ nke ya, nwee ọrụ na-eme ya obi ụtọ, nweekwa ọtụtụ ihe oriri.—Gụọ Aịzaya 9:6, 7; 65:21-23.