Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | Ị GA-AGHỌTALI IHE BAỊBỤL NA-EKWU

Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Ihe Baịbụl Na-ekwu

Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Ihe Baịbụl Na-ekwu

Weregodị ya na ị gara mba ị na-agatụbeghị mbụ. Mgbe i ruru, gị achọpụta na otú ndị ebe ahụ dị, omenala ha, nri ha, na ego ha dị ezigbote iche. O nwere ike ịgwụ gị ike.

O nwekwara ike ịdị gị otú ahụ ma ị malite ịgụ Baịbụl. Ka ị na-agụ ya, o nwere ike ịdị gị ka ị̀ banyere n’ụwa ndị oge ochie ị na-amaghị ihe ọ bụla gbasara ya. Ị ga-agụta gbasara ndị a na-akpọ ndị Filistia, gụtakwa gbasara omenala ndị ị na-ahụtụbeghị mbụ, dị ka, mmadụ ‘ịdọwa uwe’ ya, ma ọ bụkwanụ ụdị nri a na-akpọ mana nakwa ego a na-akpọ drakma. (Ọpụpụ 16:31; Jọshụa 13:2; 2 Samuel 3:31; Luk 15:9) Ihe a niile nwere ike ịgbagwoju gị anya. Ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ka onye maara Baịbụl nke ọma nyere gị aka, otú ahụ onye gara mba ọ na-agatụbeghị mbụ ga-esi chọọ ka e nyere ya aka?

IHE NYEERE NDỊ MMADỤ AKA N’OGE OCHIE

N’oge a malitere ide Baịbụl n’ihe dị ka n’afọ 1513 Tupu Oge Ndị Kraịst, e nwere ihe ndị nwere ike inyere mmadụ aka ịghọta ihe Baịbụl na-ekwu. Dị ka ihe atụ, Mozis, bụ́ onye mbụ duru ụmụ Izrel, ‘malitere ịkọwara’ ha ihe e dere na Baịbụl.—Diuterọnọmi 1:5.

Mgbe ihe dị ka otu puku afọ gachara, a ka nwere ndị na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl. N’afọ 455 Tupu Oge Ndị Kraịst, ndị Juu niile na ụmụaka ha zukọrọ n’ọnụ ụzọ ámá dị́ na Jeruselem. Ndị na-akụzi Baịbụl nọkwa ebe ahụ “jiri olu dara ụda na-agụpụta ihe dị n’akwụkwọ ahụ [dị́ nsọ].” Ma ihe ha mere abụghị naanị ịgụpụta ya, kama, “ha nọkwa na-eme ka a ghọta ihe a na-agụpụta.”—Nehemaya 8:1-8.

Mgbe narị afọ ise gachara, Jizọs Kraịst so kụziere ndị mmadụ Baịbụl. Ihe ndị mmadụ na-akpọdị ya bụ onye ozizi. (Jọn 13:13) Ọ kụziiri ìgwè mmadụ ihe, kụziekwara ndị mmadụ ihe otu otu. N’otu oge, ọ nọ n’elu ugwu kụziere ìgwè mmadụ ihe. “Otú o si ezi ihe juru ìgwè mmadụ ahụ anya.” Ọtụtụ ndị taa makwa gbasara ihe ndị ahụ ọ kụziri n’elu ugwu. (Matiu 5:1, 2; 7:28) N’oge opupu ihe ubi nke afọ 33, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya abụọ okwu ka ha nọ n’ụzọ na-aga n’otu obodo dị́ nso na Jeruselem. ‘Ọ nọ na-akọwara ha Akwụkwọ Nsọ nke ọma.’—Luk 24:13-15, 27, 32.

Ndị na-eso ụzọ Jizọs kụzikwaara ndị ọzọ Okwu Chineke. N’otu oge, otu ọnaozi Itiopia nọ na-agụ otu ebe n’Akwụkwọ Nsọ, Filip, onye na-eso ụzọ Jizọs agakwuru ya, jụọ ya, sị: “Ị̀ maara n’ezie ihe ị na-agụ?” Nwoke Itiopia ahụ zara ya, sị: “N’ezie, olee otú m ga-esi mara, ma ọ bụrụ na mmadụ eduzighị m?” Filip kọwaziiri ya ihe ihe ọ na-agụ pụtara.—Ọrụ Ndịozi 8:27-35.

IHE NA-ENYERE ANYỊ AKA TAA

Ndịàmà Jehova taa na-akụzikwara ndị mmadụ Baịbụl na narị mba abụọ na iri atọ na itoolu, otú ahụ ndị kụziri Baịbụl n’oge ochie mere. (Matiu 28:19, 20) N’izu ọ bụla, ha na-enyere ihe karịrị nde mmadụ itoolu aka ịghọta ihe Baịbụl na-ekwu. Ọtụtụ n’ime ndị ha na-akụziri Baịbụl abụghị Ndị Kraịst. Ha anaghị ana ndị mmadụ ego iji kụziere ha Baịbụl. Ha nwekwara ike ịnọ n’ụlọ onye ha chọrọ ịkụziri Baịbụl, ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ dị́ onye ahụ mma, kụziere ya Baịbụl. E nwedịrị ndị ha na-esi na fon ma ọ bụ na kọmputa akụziri ihe.

Biko, gwa Onyeàmà Jehova ọ bụla ị hụrụ ka gị na ya kwuo otú unu nwere ike isi mụwa Baịbụl. Ị ga-achọpụta na Baịbụl abụtụdịghị akwụkwọ mmadụ na-agaghị aghọtali, chọpụtakwa na ọ “bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, iji ya mee ka ihe guzozie, na iji ya nye ọzụzụ n’ezi omume” ka i wee “ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu ịrụ ezi ọrụ niile.”—2 Timoti 3:16, 17.