BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ
E Nweghị Ihe Na-atọ M Ụtọ Ka Ịkụ Bezbọl.
-
A MỤRỤ M N’AFỌ: 1928
-
ABỤ M ONYE: KOSTA RIKA
-
NDỤ M BIRI: ỊKỤ BEZBỌL NA ỊGBA CHAA CHAA RIRI M ISI
NDỤ M BIRI NA MBỤ
E toro m na Pueto Limọn. Ọ bụ ọdụ ụgbọ mmiri dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Kosta Rika. Abụ m nke asaa n’ime ụmụ asatọ nne na nna m mụrụ. Papa m nwụrụ mgbe m dị afọ asatọ. Ọ bụzi naanị mama m zụrụ anyị niile.
A naghị m e ji ịkụ bezbọl egwu egwu. M bidoro ịkụ ya mgbe m dị obere. Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri na asatọ, esonyeere m otu òtù na-amụ otú e si akụ bezbọl. Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri abụọ na otu, otu n’ime ndị isi anyị gwara m na m ga-aga Nikaragụa soro ndị aka ochie kụwa bezbọl. Ma, m jụrụ ịga n’ihi na mama m ejighị ahụ́ n’oge ahụ, ọ bụkwa m na-elekọta ya. Mgbe obere oge gachara, onyeisi ọzọ gwara m ka m bịa soro òtù egwuregwu bezbọl ndị na-eto eto e nwere n’obodo anyị bụ́ Kosta Rika. Na nke ugbu a, ekwetara m. Akụụrụ m òtù egwuregwu obodo anyị bezbọl malite n’afọ 1949 ruo afọ 1952. M kụrụ bezbọl na Kuba, Meksiko nakwa na Nikaragụa. M na-akụ bezbọl nke ọma. O nwedịrị mgbe m kụrụ bezbọl ugboro iri na asaa na-akwụsịghị akwụsị, enweghịkwa bọl danahụrụ m. Obi na-atọgbu m atọgbu ma ndị mmadụ na-etu m aha ma m na-akụ bezbọl.
M bikwara ndụ na-adịghị mma, ma ọ na-ewute m na m biri ụdị ndụ ahụ. Ọ bụ eziokwu na enwere m ike ịsị na enwere m naanị otu enyi nwaanyị, ma, e nwere ụmụ nwaanyị ndị ọzọ mụ na ha na-akpa. M na-aṅụkwa oké mmanya. Otu ụbọchị, aṅụchara m mmanya nke na mgbe m tetara n’ụtụtụ echi ya, enweghịzi m ike icheta otú m si lọta. Agbakwara m chaa chaa na lọtrị.
Mgbe m nọ na-ebi ụdị ndụ a, mama m ghọrọ Onyeàmà Jehova. Ọ gbara mbọ ime ka m soro ya bụrụ Onyeàmà Jehova, ma mbọ ya niile kụrụ afọ n’ala n’ihi na n’oge ahụ, enweghị ihe ọzọ na-echụ m ụra ma ọ bụghị ịkụ bezbọl. Ọ na-abụ m na-akụ bezbọl oge nri eruo, mụ akụkwara na-aga n’agbanyeghị na agụụ ji m. Obi m niile na-anọ n’ịkụ bezbọl. E nweghị ihe na-atọ m ụtọ ka ịkụ bezbọl.
Ma, mgbe m dị afọ iri abụọ na itoolu, emerụrụ m ezigbo ahụ́ ebe m na-achọ ịghọ bọl. Mgbe m gbakere, akwụsịrị m ịkụ bezbọl. Ma, m bidoro ịna-akụziri otu òtù na-amụ ịkụ bezbọl nọ nso n’ebe m bi, otú e si akụ bezbọl.
OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M
N’afọ 1957, Ndịàmà Jehova gwara m ka m bịa mgbakọ ha ga-enwe n’ámá egwuregwu m nọtụrụla kụọ bezbọl, agakwara m. Ná mgbakọ ahụ, m chọpụtara na ndị bịara ya anaghị eme aghara. Ha na-akwanyere onwe ha ùgwù. Ha anaghịkwa eme ka ndị bịara ile egwuregwu bezbọl. Ihe m hụrụ ná mgbakọ ahụ mere ka mụ na Ndịàmà Jehova malite ịmụ Baịbụl, mụ agawakwa ọmụmụ ihe ha.
Ọtụtụ ihe m mụtara na Baịbụl tọrọ m ezigbo ụtọ. Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru na n’oge ikpeazụ, ndị na-eso ụzọ ya ga-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile. (Matiu 24:14) Ihe ọzọ m mụtara bụ na anaghị akwụ ezigbo Ndị Kraịst ụgwọ maka ozi ọma ha na-ezi. Jizọs kwuru, sị: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.”—Matiu 10:8.
Ka m na-amụ Baịbụl, eji m ihe Baịbụl kwuru tụnyere ihe ndị m hụrụ Ndịàmà Jehova na-eme. Otú ha si agba mbọ ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile tọrọ m ezigbo ụtọ. M chọpụtakwara na ha na-enyere ndị ọzọ aka otú ahụ Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-eme. N’ihi ya, mgbe m gụrụ Mak 10:21 ma hụ na Jizọs na-akpọ anyị ka anyị ‘bịa bụrụ ndị na-eso ụzọ ya,’ m kpebiri na m ga-abụ Onyeàmà Jehova.
Ma, o siiri m ike ime ihe a m kpebiri. Dị ka ihe atụ, e nwere nọmba m na-agba kwa izu na lọtrị a na-agba n’obodo anyị. M gbara nọmba a ruo ọtụtụ afọ. Ma, m mụtara na Baịbụl na Chineke kpọrọ ndị na-efe “chi Ihu Ọma” nakwa ndị anyaukwu asị. (Aịzaya 65:11; Ndị Kọlọsi 3:5) Ọ bụ ya mere m ji kwụsị ịgba lọtrị. Na Sọnde mbụ m kwụsịrị ịgba ya, ndị gbara nọmba ahụ m na-eji agba, ritere ego. Ndị mmadụ chịrị m ọchị n’ihi na agbaghị m lọtrị n’izu ahụ. Ha nyewakwara m nsogbu ka m gbaa lọtrị ọzọ, ma ekweghị m. Si mgbe ahụ gawa, enwebeghị mgbe ọzọ m gbara lọtrị.
E nwere ọnwụnwa ọzọ bịaara m n’ụbọchị e mere m baptizim ná mgbakọ Ndịàmà Jehova. Ọnwụnwa a ga-egosi ma m̀ yirila “mmadụ ọhụrụ ahụ.” (Ndị Efesọs 4:24) Mgbe m laghachiri na họtel ebe m bi, ahụrụ m enyi m nwaanyị ahụ ebe ọ nọ n’ọnụ ụzọ na-eche m. Ọ sịrị m: “Sammy, bịanụ ka anyị mee onwe anyị obi ụtọ.” Ma, m sịrị ya mba ozugbo. M gwara ya na m na-emezi ihe Baịbụl kwuru. (1 Ndị Kọrịnt 6:18) Mgbe m gwachara ya, ya asị m hapụgodinụ Baịbụl, ma bịa ka anyị mee onwe anyị obi ụtọ otú anyị si emebu. O bidoro ikwu ihe ndị gosiri na o nweghị ihe o ji ihe Baịbụl kwuru banyere ịkwa iko kpọrọ. Ma, m hapụrụ ya banye n’ime ụlọ gbachie ụzọ. Taa, obi dị m ụtọ na kemgbe ahụ m ghọrọ Onyeàmà Jehova n’afọ 1958, alaghachibeghị m n’àgwà ọjọọ ndị ahụ m na-akpabu.
URU NDỊ M RITERELA
Ọ na-adị m ka m dee akwụkwọ ma kọọ uru ndị m riterela n’ihi ime ihe Baịbụl kwuru. Ụfọdụ uru ndị ahụ bụ na enwere m ezigbo ndị enyi ugbu a, nwee ezigbo obi ụtọ, jirikwa ndụ m na-eme ihe bara uru.
Ịkụ bezbọl ka na-atọ m ụtọ, ma ọ bụghịzi ya ka m mkpa ná ndụ. Mgbe m na-akụ bezbọl, aghọrọ m onye a ma ama, nweekwa ezigbo ego, ma ha adịteghị aka. Ma, adị m ná mma mụ na Chineke na ụmụnna m ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Baịbụl kwuru, sị: “Ụwa na-agabiga, ọchịchọ ya na-agabigakwa, ma onye na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:17) Ugbu a, ahụrụ m Jehova na ndị ya n’anya karịa ihe ọ bụla ọzọ.