Daniel: Nwoke Nwere Okwukwe ná Ndụ Ya Niile

Mgbe a kpọpụrụ Daniel n’ụlọ ha, a nwara ya ọnwụnwa ịkwụsị inwe okwukwe na Jehova nakwa irubere ya isi. Ma ọ nọgidere na-atụkwasị Jehova obi n’agbanyeghị nsogbu ndị bịaara ya.

Daniel: Nwoke Nwere Okwukwe ná Ndụ Ya Niile​—⁠Agba nke Mbụ

Daniel ọ̀ ga-ahapụ Chineke ya bụ́ Jehova ugbu a ọ na-anọghịzi n’ụlọ ha, e bibiekwala obodo ha?

Daniel: Nwoke Nwere Okwukwe ná Ndụ Ya Niile​—⁠Agba nke Abụọ

Alaeze ọzọ dị ike meriri Babịlọn, ma malite ịchị ya. O mere ka Daniel nwee ndị iro ọhụrụ na-emegide ya. Ọ bụ n’oge a ka a kacha nwaa Daniel ọnwụnwa ịkwụsị inwe okwukwe na Chineke.