Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe​—Vidio

Lee vidio ndị a ka ịmụta ihe ndị ga-eme ka ị bụrụ aka ochie n’ịgụ ihe na n’izi ihe n’ihu ọha.

IHE ỌMỤMỤ NKE 1

Okwu Mmeghe Na-adọrọ Mmasị

Olee ihe ị ga-eme ka ndị na-ege gị ntị nwee mmasị n’ihe ị na-aga ịgwa ha?

IHE ỌMỤMỤ NKE 2

Ikwu Okwu Ka Ebe Mmadụ na Ibe Ya Na-akparịta Ụka

Olee ihe ị ga-eme ka obi ruo ndị ị na-agwa okwu ala mgbe ị na-ekwu okwu?

IHE ỌMỤMỤ NKE 3

Ịjụ Ajụjụ

Olee otú i nwere ike isi jiri ajụjụ kụziere ndị ị na-agwa okwu ihe, jiri ya mee ka uche ha dịrị n’ihe ị na-ekwu, jirikwa ya mee ka isi ihe ndị dị n’okwu gị doo anya?

IHE ỌMỤMỤ NKE 4

Webata Akwụkwọ Nsọ Otú Dị Mma

Olee otú ị ga-esi kwadebe obi ndị ị na-agwa okwu tupu ị gụwa ebe ị chọrọ ịgụ na Baịbụl?

IHE ỌMỤMỤ NKE 5

Ịgụzi Ihe Agụzi

Olee ihe ndị ga-enyere mmadụ aka ịna-agụpụta kpọmkwem ihe e dere n’akwụkwọ?

IHE ỌMỤMỤ NKE 6

Kọwaa Ihe Ị Gụrụ n’Akwụkwọ Nsọ Otú Ga-edo Anya

Gịnị ka ị ga-eme ma ị gụcha Baịbụl ka ndị ị na-agwa okwu ghọta ihe mere i ji gụọ ebe ahụ?

Kụzie Ihe Bụ́ Eziokwu Otú Ga-eme Ka Ndị Ị Na-agwa Okwu Kweta Ya

Olee otú ị ga-esi jide n’aka na ihe ị na-ekwu bụ eziokwu?

IHE ỌMỤMỤ NKE 8

Jiri Ihe Atụ Na-akụzi Ihe

Olee otú anyị ga-esi jiri ihe atụ na-akụzi ihe nke ọma ka Onye Ozizi Ukwu ahụ?

IHE ỌMỤMỤ NKE 9

Iji Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Akụzi Ihe nke Ọma

Olee otú ị ga-esi jiri ihe ndị e sere ese ma ọ bụ ihe ndị ọzọ a na-ahụ anya nyere ndị ị na-agwa okwu aka ịghọta isi ihe ị na-ekwu?

IHE ỌMỤMỤ NKE 10

Ịgbanwe Ụda Olu

Olee otú ịgbanwe ụda olu ga-esi nyere gị aka ime ka ihe ị na-akụzi doo anya, meekwa ka ndị ị na-agwa okwu chọọ ime ihe ị na-agwa ha?

IHE ỌMỤMỤ NKE 11

Ịnụ Ọkụ n’Obi

Olee otú ị ga-esi jiri ịnụ ọkụ n’obi mee ka ndị na-ege gị ntị mee ihe ị na-akụzi?

IHE ỌMỤMỤ NKE 12

Jiri Mmetụta Kwuo Okwu

Olee otú ị ga-esi jiri ezigbo mmetụta gwa ndị mmadụ okwu?

IHE ỌMỤMỤ NKE 13

Mee Ka Uru Ihe Ị Na-ekwu Bara Doo Anya

Olee otú ị ga-esi kwuo okwu ka ndị ị na-agwa okwu ghọta uru ihe ị na-ekwu bara ma mee ihe ị na-akụzi?

IHE ỌMỤMỤ NKE 14

Mee Ka Ihe Ndị Gbara Ọkpụrụkpụ n’Okwu Gị Doo Anya

Mee ka isi ihe ndị dị n’okwu gị doo anya ka uche ndị ị na-agwa okwu nwee ike ịdị n’ihe ị na-ekwu, ka ha ghọta ya, nakwa ka ha ghara ichefu ya.

IHE ỌMỤMỤ NKE 15

Gosi na I Kwetasiri ike n’Ihe Ị Na-ekwu

Olee otú ị ga-esi kwuo okwu otú ga-egosi na i kwetasiri ike n’ihe ị na-ekwu ma i mewe ihe omume n’ọmụmụ ihe ma ọ bụkwanụ na-ezi ozi ọma?

IHE ỌMỤMỤ NKE 16

Okwu Na-agba Ume Ma Na-aba Uru

Olee ihe atọ anyị nwere ike ime iji kwuo ihe ga-enyere ndị ọzọ aka ma gbaa ha ume ma anyị kwuwe okwu ma n’ọmụmụ ihe ma n’ozi ọma?

IHE ỌMỤMỤ NKE 17

Ikwu Ihe Ndị Ọzọ Ga-aghọtali

Olee ihe ndị i kwesịrị izere iji nyere ndị ị na-agwa okwu aka ịghọta ihe ị na-ekwu nke ọma?

IHE ỌMỤMỤ NKE 18

Mee Ka Ndị Na-ege Ntị Mụta Ihe na Ya

Olee otú i nwere ike isi mee ka ndị ị na-agwa okwu chebara ihe ị na-ekwu echiche ma mụta ihe ọhụrụ n’okwu gị?

IHE ỌMỤMỤ NKE 19

Gbalịa Ka Ihe Ị Na-ekwu Ruo Ndị Mmadụ n’Obi

Olee otú i nwere ike isi nyere ndị ị na-agwa okwu aka ka ọ bụrụ ezi ihe mere ha ji achọ ime ihe ndị ha na-amụta?

IHE ỌMỤMỤ NKE 20

Mee Ka Okwu Mmechi Gị Kpoo Ọkụ

Ma ị̀ na-eme ihe omume n’ọmụmụ ihe ma ị̀ na-ezi ozi ọma, olee ihe ndị i kwesịrị ime ka okwu mmechi gị kpoo ọkụ? Lee vidio a ka ị chọpụta.

Isiokwu A Nwekwara Ike Ịmasị Gị

AKWỤKWỌ NA BROSHỌ

Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe

E bipụtara akwụkwọ a iji nyere gị aka ka ị bụrụ aka ochie n’ịgụ ihe n’ihu ọha, n’ikwu okwu na n’ịkụzi ihe.