Gaa n'Isiokwu

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

Ha Chọtara “Nkume Pel Dị Oké Ọnụ”

Ha Chọtara “Nkume Pel Dị Oké Ọnụ”

 Jizọs kụziri na Alaeze Chineke ga-akwụsị nsogbu ndị mmadụ na-enwe taa. (Matiu 6:10) Na Matiu 13:44-46, o mere ihe atụ abụọ iji gosi uru eziokwu banyere Alaeze Chineke bara. Ihe atụ abụọ ahụ bụ:

  •   Otu nwoke nọ na-arụ ọrụ n’otu ala ma hụ akụ̀ e zoro n’ala ahụ.

  •   Otu onye ahịa na-achọ nkume pel mara mma hụrụ nkume pel dị oké ọnụ.

 Ha abụọ ji obi ụtọ gaa ree ihe niile ha nwere ka ha nwee ike ịzụta akụ̀ ahụ ha hụrụ. Mmadụ abụọ a nọchiri anya ndị ji ihe banyere Alaeze Chineke kpọrọ ezigbo ihe, nke na ha na-ahapụ ọtụtụ ihe iji nweta ngọzi Alaeze ahụ. (Luk 18:29, 30) Na vidio a, ị ga-ahụ otú mmadụ abụọ e gosiri na ya si mee ka mmadụ abụọ ahụ Jizọs ji maa atụ.