Gaa n'Isiokwu

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

“Ime Mpụ na Ịhụ Ego n’Anya Kpataara M Ezigbo Nsogbu”

“Ime Mpụ na Ịhụ Ego n’Anya Kpataara M Ezigbo Nsogbu”
  • A Mụrụ M n’Afọ: 1974

  • Abụ M Onye: Albenia

  • Ndụ M Biri: Abụ m onye ohi, na-ere ọgwụ ike, gaakwa mkpọrọ

NDỤ M BIRI NA MBỤ

 Abụ m onye Tirana bụ́ isi obodo Albenia. Ezinụlọ anyị dara ogbenye. Papa anyị bụ nwoke na-akwụwa aka ọtọ. Ọ na-arụkwa ọrụ ọtụtụ awa n’ụbọchị ka o nwee ike ịna-akpa afọ anyị. Ma, ego ọ na-akpata anaghị ezu igbo mkpa anyị. Mgbe m dị obere, obi anaghị adị m mma na anyị dara ogbenye. N’oge ahụ, ọ na-esi ike ịhụ ego a ga-eji zụtara m akpụkpọ ụkwụ, e nwekwara oge ndị m na-anọ agụụ n’ihi na anyị enweghị ihe anyị ga-eri.

 M bidoro na nwata zuwe ohi. M na-agwa onwe m na m si otú a enye aka akpa afọ ezinụlọ anyị. Ma otu ụbọchị, ndị uwe ojii jidere m. Ihe a mere ka papa m kpọga m n’otu ụlọ akwụkwọ ebe a na-enyere ụmụaka na-eme mpụ aka. Ọ kpọgara m ebe ahụ n’afọ 1988 mgbe m dị afọ iri na anọ. M nọrọ afọ abụọ ebe ahụ. Amụtakwara m otú e si agba ihe ọkụ. Mgbe m pụtara, m chọrọ ịna-ebi ezigbo ndụ, mana, enwetaghị m ọrụ. Inweta ọrụ na-esi ezigbo ike n’oge ahụ n’Albenia n’ihi ọgba aghara ịzọ ọchịchị kpatara. Ihe a gwụrụ m ike nke na mụ na ndị enyi m mbụ bidokwara kpawa ọzọ, mụ ebidokwa izu ohi ọzọ. Otu ụbọchị, a nwụchiri mụ na ndị enyi m ndị ahụ, tụọkwa anyị mkpọrọ afọ atọ.

 Mgbe m si na mkpọrọ pụta, ebidoro m ime mpụ ọzọ. Akụnụba obodo anyị bụ́ Albenia dara, ọgba aghara ejukwa ebe niile. N’oge ahụ, m si n’ihe ndị iwu na-akwadoghị m na-eme nwee ezigbo ego. E nwere otu oge mụ na ndị òtù m ji égbè gaa ohi, e jide mmadụ abụọ n’ime anyị, mụnwa erie mbọmbọ gbaga obodo ọzọ ka a ghara ijide m tụọ m mkpọrọ ruo ogologo oge. N’oge ahụ, alụọla m nwaanyị. Aha nwunye m bụ Julinda. Anyị amụọkwala otu nwa nwoke.

 Anyị mechara gaa biri n’Ịngland. Obi m niile bụ ka m malite biwe ezigbo ndụ n’ebe a mụ na nwunye m na nwa anyị nwoke bizi. Mana, àgwà ọjọọ m eriela m ahụ́. O teghị aka, mụ ebidokwa ime mpụ ọzọ. Nke m na-eme n’oge a bụ ire ọgwụ ike. Ezigbo ego na-abatakwa m aka.

 Olee otú obi dị Julinda nwunye m maka ọgwụ ike ahụ m na-ere? Ngwa, ka o jiri ọnụ ya kọọrọ gị: “Mgbe m na-etolite n’Albenia, m na-agwa onwe m na otu ụbọchị, ogbenye a m bụ ga-aghọ ihe akụkọ. Adị m njikere ime ihe ọ bụla ga-eme ka ihe dịtụrụ m mfe. Echere m na inwe ezigbo ego ga-eme ka ndụ anyị ka mma. N’ihi ya, m ji obi m niile na-akwado di m n’ụgha ọ na-agha, n’ohi ọ na-ezu, n’ọgwụ ike ọ na-ere, nakwa n’ihe ọ bụla ọzọ ọ na-eme iji nweta ego.”

“M ji obi m niile na-akwado di m n’ụgha ọ na-agha, n’ohi ọ na-ezu, n’ọgwụ ike ọ na-ere, nakwa n’ihe ọ bụla ọzọ ọ na-eme iji nweta ego.”​—Julinda

 Ma, n’afọ 2002, ndụ anyị gbanwere, atụmatụ anyị na-eme ịba ọgaranya bịakwara ghasaa n’otu ntabi anya. E jidere m ebe m bu ọgwụ ike hiri ezigbo nne na-aga ebe ọzọ, a tụọkwa m mkpọrọ ọzọ.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M

 Tupu mụ amara ihe na-eme, Baịbụl malitere ịgbanwe ndụ m. N’afọ abụọ gara aga, ya bụ, n’afọ 2000, nwunye m hụrụ Ndịàmà Jehova, ya na ha ebidokwa ịmụ Baịbụl. Enweghị m mmasị ịmụ Baịbụl n’ihi na m chere na ịmụ ya na-agwụ ike. Mana, ọ na-atọ nwunye m ụtọ. O kwuru, sị: “Ndị ezinụlọ anyị bụ ndị chọọchị, ejighịkwa m Baịbụl egwu egwu. M na-achọkarị ịmụta ihe na ya, obi dịkwa m ezigbo ụtọ na mụ na Ndịàmà Jehova mụrụ Baịbụl. Achọpụtara m na ọtụtụ ihe Baịbụl na-akụzi bara ezigbo uru. Ihe ndị m mụtara nyeere m aka ịgbanwe ihe ụfọdụ ná ndụ m. Ma, a bịa n’okwu gbasara ego, agbanweghị m ruo mgbe a nwụchiri di m. Ọ bụ mgbe a nwụchiri ya ka m bịara chebara onwe m echiche. Ozugbo ahụ ka m ghọtara na ihe Baịbụl kwuru gbasara ego bụ eziokwu. Anyị achụọla ego ọnwụ ọnwụ, mana o meghị anyị obi ụtọ. Ọ bịara doo m anya na m kwesịrị iso ihe ọ bụla Chineke kwuru.”

 N’afọ 2004, a tọhapụrụ m n’ụlọ mkpọrọ. O teghịkwa aka mụ ebidoghachi ire ọgwụ ike. Mana, nwunye m echegharịala. E nwere ihe o kwuru otu ụbọchị mere ka m chebara onwe m ezigbo echiche. Ọ sịrị: “Achọghịzi m ego gị. Achọrọ m ka di m lọghachi. Achọrọ m ka nna ụmụ m nọrọ ebe a na-elekọta ha.” Ihe a o kwuru juru m anya. Ma, o kwutere ya. Anọọla m ọtụtụ afọ ebe ọzọ hapụ ezinụlọ m. Echetakwara m ọtụtụ ahụhụ ndị m tarala n’ihi ịchụ ego otú na-adịghị mma. Ihe a mere ka m kpebie ịgbanwe ndụ m ma kwụsị iso ndị enyi m mbụ na-akpa.

 Isi sekpụ ntị mere m ji gbanwee bụ ihe m hụrụ otu oge m so nwunye m na ụmụ anyị abụọ gaa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Obi tọrọ m ezigbo ụtọ na ndị m hụrụ ebe ahụ bụ ndị ji obi ha niile na-emeso ibe ha ihe ka enyi na enyi. Emechara m malite ịmụ Baịbụl.

M nọbu na-eche na inwe ezigbo ego ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ

 Ka m na-amụ Baịbụl, m mụtara na “ịhụ ego n’anya bụ mgbọrọgwụ ụdị ihe ọjọọ niile. O meela ka ụfọdụ ndị dapụ n’okwukwe, meekwa ka ahụ́ niile na-afụ ha ụfụ ka ndị mara onwe ha mma aghara aghara.” (1 Timoti 6:​9, 10) O doro m anya na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu. M na-akwa ezigbo m mmakwaara maka ndụ m biri na mbụ nakwa ọtụtụ nsogbu ọ kpataara mụ na ezinụlọ m. (Ndị Galeshia 6:7) Mgbe m ghọtara otú Jehova na Jizọs Kraịst, bụ́ Ọkpara ya, hụruru anyị n’anya, m bidoro ịgbanwe àgwà m. Amalitere m ịna-echekarị gbasara ndị ọzọ kama ịna-echekarị gbasara onwe m. Otu n’ime ihe ndị m mere bụ ịna-ewepụtakwu oge ka mụ na ndị ezinụlọ m na-anọrị.

URU NDỊ M RITERELA

 Baịbụl kwuru, sị: “Ka otú unu si ebi ndụ gosi na unu ahụghị ego n’anya, kama ka ihe ndị dị ugbu a ju unu afọ.” Ime ihe a abaarala m uru. (Ndị Hibru 13:5) Obi ruziri m ala ugbu a, akọnuche m anaghịzi ama m ikpe. Ihe a emeela ka m na-enwe ụdị ọṅụ m na-enwetụbeghị mbụ. Mụ na nwunye m adịkwuola ná mma, mụ na ezinụlọ m na-emekọkwa ihe ọnụ ugbu a karịa na mbụ.

 M nọbu na-eche na inwe ezigbo ego ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ. Ma ugbu a, ahụla m na ime mpụ na ịhụ ego n’anya kpataara m ezigbo nsogbu. Anyị abaghị ọgaranya, ma n’uche m, anyị ahụla ihe kacha mkpa ná ndụ anyị, ya bụ, anyị na Jehova Chineke ịbụ enyi. Mụ na ezinụlọ m iji otu obi na-efekọ Chineke ọnụ na-eme anyị ezigbo obi ụtọ.

Oge mụ na ezinụlọ m gara otu mgbakọ ukwu Ndịàmà Jehova nwere