BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ
Ndụ M Nọ Na-akawanye Njọ
A Mụrụ M n’Afọ: 1971
Abụ M Onye: Tọnga
Ndụ M Biri: Ana m aṅụ ọgwụ ọjọọ, a tụrụ m mkpọrọ
NDỤ M BIRI NA MBỤ
Anyị bụ ndị Tọnga. Ihe mejupụtara obodo anyi bụ agwaetiti otu narị na iri asaa ndị dị n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ Pasifik. Anyị enwechaghị ihe ndị e ji ebi ndụ na Tọnga. Anyị enweghị ụgbọala ma ọ bụ ọkụ eletrik. Ma, anyị nwere pọmpụ n’ụlọ anyị, nweekwa ọkụkọ ole na ole. Mgbe ọ bụla ụlọ akwukwọ anyị mechiri, mụ na ụmụnne m ndị nwoke abụọ na-aga enyere mpa anyi aka n’ugbo ebe anyị dọrọ banana, kọọkwa ji, ede, na akpụ. Mpa m na-eji ego ndị o retara n’ihe ndị a nakwa ụmụ obere ọrụ ndị ọzọ ọ na-arụ elekọta ezinụlọ anyị. Ndị ezinụlọ anyị anaghị eji Baịbụl egwu egwu, otú ahụ ka ọ dịkwa ọtụtụ ndị bi n’agwaetiti a. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị chere na ihe ga-eme ka ndụ anyị kakwuo mma bụ ịkwaga ná mba bara ọgaranya.
Mgbe m dị afọ iri na isii, nwanne mma m kpọọrọ anyị niile gawa Kalịfọnịa dị n’Amerịka. Ịmụta otú e si eme ihe n’ebe ahụ adịghịrị anyị mfe ma otu. Ọ bụ eziokwu na ebe ọhụrụ a anyị kwagara mere ka anyị na-enwetatụkwu ego, ma anyị bi n’ebe ndị ogbenye bi. A na-eme ihe ike ebe ahụ, na-aṅụkwa ọgwụ ike na ya. Anyị na-anụkarị ụda égbè n’abalị. Ọtụtụ ndị agbata obi anyị na-atụkwa ụjọ ndị òtù ọjọọ. Ọtụtụ ndị na-eji égbè agagharị iji chebe onwe ha ma ọ bụ iji dozie esemokwu. N’otu n’ime oge e nwere ọgba aghara, a gbara m égbè n’obi. Mgbọ égbè ahụ ka nọkwa m n’obi ruo taa.
Mgbe m bara ụlọ akwụkwọ sekọndrị, m chọrọ imewa ka ndị ndị na-eto eto ibe m. Nwayọọ nwayọọ, m bidoro ịna-aga oriri na nkwari, bụ́ ebe a na-eme ihe ọjọọ dị iche iche, na-aṅụ oké mmanya, na-eme ihe ike ma na-aṅụkwa ọgwụ ike. Ka oge na-aga, ịṅụ koken bịara rie m ahụ́. M malitere ịna-ezu ohi ka m nweta ego m ga na-eji azụ ọgwụ ike. N’agbanyeghị na ndị ezinụlọ anyị anaghị eji chọọchị egwu egwu, o nweghị ihe m mụtara na chọọchị ga-enyeliri m aka ịkwụsị nsogbu ndị ọgbọ m na-enye m ime ihe ọjọọ. A nwụchiri m ọtụtụ ugboro maka ihe ike m na-eme. Ndụ m nọ na-akawanye njọ. E mechara tụọ m mkpọrọ.
OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M
Otu ụbọchị n’afọ 1997, mgbe m nọ n’ụlọ mkpọrọ, otu onye mkpọrọ ibe m hụrụ ka m ji Baịbụl n’ụbọchị Krismas. Ọtụtụ ndị Tọnga weere ụbọchị a ka ụbọchị dị oké nsọ. Ọ jụrụ m ma m̀ ma ihe Baịbụl kwuru gbasara ọmụmụ Kraịst, mụ agwa ya na amaghị m. O gosiri m ihe Baịbụl kwuru banyere ọmụmụ Jizọs. M bịara ghọta na ọtụtụ ihe ndị a na-eme na Krismas adịghịdị na Baịbụl. (Matiu 2:1-12; Luk 2:5-14) Ihe ndị a m chọpụtara enyeghị m ọnụ okwu, m nọkwa na-eche na a ga-enwe ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru m na-amaghị. Nwoke ahụ na-aga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova na-enwe kwa izu n’ụlọ mkpọrọ, m kpebikwara iso ya na-aga. Ụbọchị mbụ m gara, ha nọ na-amụ Akwụkwọ Mkpughe. N’agbanyeghị na ọ bụ obere ihe ka m ghọtara n’ihe niile ha kwuru, ma achọpụtara m na ihe niile ha kụziri si na Baịbụl.
Ndiàmà Jehova gwara m ka ha mụwara m Baịbụl, mụ ekweta ozugbo. Ọ bụ mgbe mbụ m matara na Chineke kwere nkwa ime ka ụwa ghọọ paradaịs. (Aịzaya 35:5-8) Ọ bịara doo m anya na m kwesịrị ịgbanwe otú m si ebi ndụ ka m nwee ike ime ihe dị Chineke mma. Amụtara m na Jehova Chineke agaghị ekwe ka m baa na Paradaịs ma ọ bụrụ na m nọgide na-akpa àgwà ọjọọ ndị m na-akpa. (1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10) N’ihi ya, ekpebiri m ịkwụsị ịna-ewe iwe ọkụ, ịṅụ sịga, ịṅụ oké mmanya na ịṅụ ọgwụ ike.
N’afọ 1999, e bugara m n’ụlọ mkpọrọ ọzọ tupu mụ anọzuo mkpọrọ afọ ole a tụrụ m. O nweghị Ndịàmà Jehova m hụrụ n’ebe ọhụrụ ahụ e bugara m ruo ihe karịrị otu afọ. Ma m kpebiri ịnọgide na-eme mgbanwe ná ndụ m. N’afọ 2000, ndị ọchịchị kagburu akwụkwọ ikike m ji nọrọ n’Amerịka. Ha gbaara m ụgbọ nwa mkpi laghachị Tọnga.
Mgbe m ruru Tọnga, agbalịrị m chọta Ndịàmà Jehova ma malitekwa ịmụ Baịbụl. Ihe ndị m na-amụta na-atọ m ụtọ. Obi tọkwara m ụtọ mgbe m chọpụtara na ihe niile Ndịàmà Jehova nọ n’obodo anyị na-akụzi si na Baịbụl otú ahụ ndị nke nọ n’Amerịka na-eme.
A ma mpa m ama n’obodo anyị n’ihi na o nwere ọkwá ukwu na chọọchị. N’ihi ya, otu oge ndị ezinụlọ anyị si Amerịka lọta ụlọ ma chọpụta na mụ na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl, o juru ha anya, obi adịghịkwa ha mma. Ma ka oge na-aga, ọ masịrị ndị mụrụ m mgbe ha hụrụ na ihe ndị m mụtara na Baịbụl na-enyere m aka ịkwụsị àgwà ọjọọ ndị m na-akpabu.
Otu n’ime ihe ndị siiri m ike ịkwụsị bụ iso aṅụ otu mmanya ọtụtụ ndị na-aṅụbiga ókè n’obodo anyị. Ọtụtụ ụmụ nwoke ndị Tọnga na-eji ogologo oge aṅụ mmanya na-akụjụ ahụ́ a na-akpọ kava. Mgbe m lọtara, m bidoro ịga ebe a na-aṅụ kava n’abalị ọ bụla. M na-aṅụgide ya ruo mgbe m na-agaghị ama onwe m. Ihe so kpatara m nsogbu a bụ na mụ na ndị na-ejighi ihe Baịbụl kwuru kpọrọ ihe na-akpachi anya. Ma, e mechara mee ka m ghọta na ihe a m na-eme na-ewute Chineke. Akwụsịrị m ịṅụbiga mmanya ókè ka ihe m nwee ike ịna-adị Chineke mma, ya anagọzikwa m.
Ebidoro m ịna-aga ọmụmụ ihe niile Ndịàmà Jehova na-enwe. Mụ na ndị na-agba mbọ ịna-eme ihe Chineke na-achọ ịna-akpachi anya nyeere m aka ịkwụsị ihe ọjọọ m na-emebu. N’afọ 2002, e mere m baptizim, mụ aghọọ Onyeàmà Jehova.
URU NDỊ M RITERELA
Ndidi Chineke na-enwere anyị nke e kwuru okwu ya na Baịbụl, abaarala m uru. Baịbụl sịrị: “Jehova . . . na-enwere unu ndidi n’ihi na ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.” (2 Pita 3:9) Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ raghị Chineke ahụ́ ibibi ụwa ọjọọ a kemgbe, ma o kwere ka ogologo oge gafee ka ya na ndị dị ka m nwee ike ịdị mma. Obi na-atọ m ụtọ ịmara na site na enyemaka Jehova, m nwere ike inyere ndi ọzọ aka ha amata ya.
Jehova nyeere m aka ịkwụsị àgwà ọjọọ ndị gaara ata isi m. Anaghịzi m ezuru ihe ndị mmadụ iji nweta ego m ji aṅụ ọgwụ ike. Kama nke ahụ, m na-agba mbọ inyere ndị ọzọ aka ka ha na Jehova dịrịkwa ná mma. Alụrụ m Onyeàmà Jehova ibe m aha ya bụ Tea. Anyị mụtara otu nwa nwoke. Anyị na-enwekwa obi ụtọ n’ezinụlọ anyị. Anyị na-akụziri ndị mmadụ na Baịbụl kwuru na anyị ga-adị ndụ ebighi ebi na Paradaịs ebe udo ga na-adị..