“M Na-eme Ihe m Nwere Ike Ime”
Irma, onye bi na Jamani, afọla obere ka o ruo afọ iri itoolu. Mgbe o nwechara nnukwu ihe mberede ugboro abụọ, a waakwa ya ahụ́ ọtụtụ ugboro, o nwelizighị ike ịga ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Otú Irma sizi ezi ozi ọma ugbu a bụ ide akwụkwọ ozi o ji agba ndị mmadụ ume, na nke o ji akasi ndị mmadụ nwụnahụrụ obi. Akwụkwọ ozi Irma na-ede na-amasị ndị mmadụ nke mere na ọtụtụ ndị na-akpọkarị ya n’ekwentị na-ajụ ya mgbe ọzọ akwụkwọ ozi ya ga-abịa. Ọtụtụ ndị detakwaara ya akwụkwọ ozi iji kelee ya ma rịọ ya ka o detara ha akwụkwọ ozi ọzọ. Irma kwuru, sị: “Ihe a niile na-eme m obi ụtọ, na-emekwa ka okwukwe m sie ike.”
Irma na-edegakwara ndị nọ n’ebe a na-elekọta ndị ahụ́ na-esighị ike akwụkwọ ozi. O kwuru, sị: “Otu nwaanyị merela agadi kpọrọ m ma kwuo na akwụkwọ ozi m detaara ya mgbe di ya nwụrụ kasiri ya obi. O tinyere akwụkwọ ozi ahụ na Baịbụl ya ma na-agụ ya n’uhuruchi. Nwaanyị ọzọ di ya nwụrụ n’oge na-adịbeghị anya kwuru na akwụkwọ ozi m enyerela ya aka karịa okwuchukwu ụkọchukwu ha kwuru. O nwere ọtụtụ ajụjụ ọ ga-ajụ. Ọ jụrụ m ma ya nwere ike ịbịa na nke m.”
Otu enyi Irma na-abụghị Onyeàmà Jehova kwagara ebe ọzọ dịtụ anya. Ọ gwara Irma ka ọ na-edetara ya akwụkwọ ozi. Irma kwuru, sị: “Nwaanyị a dewere akwụkwọ ozi niile m degaara ya. Mgbe ọ nwụrụ, nwa ya nwaanyị kpọrọ m n’ekwentị. Ọ gwara m na ya agụọla akwụkwọ ozi niile m deere mama ya ma rịọ m ma m̀ nwere ike ịna-edetakwara yanwa ụdị akwụkwọ ozi a e ji akụzi Baịbụl.”
Ozi ọma Irma si otú a ekwusa na-atọ ya ụtọ. Ọ sịrị: “M na-arịọ Jehova ka o nye m ike m ga-eji na-ejere ya ozi. Ọ bụ eziokwu na m naghị agalizi site n’ụlọ ruo n’ụlọ, m na-eme ihe m nwere ike ime.”