O Si n’Aka Ndị Mkpọrọ Mụta Ihe
Otu nwoke si Eritria gbata ọsọ ndụ na Nọọwee n’afọ 2011. Mgbe Ndịàmà Jehova bịara na nke ya, o kwuru na ya ahụtụla Ndịàmà Jehova n’obodo ya. O kwuru na mgbe ya nọ n’amị, ya hụrụ na Ndịàmà Jehova a tụrụ mkpọrọ n’ihi ihe ha kweere ekweghị aba amị, n’agbanyeghị ahụhụ niile a tara ha.
Mana, egwu dagharịrị, a tụọ nwoke a mkpọrọ. Mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, ọ hụrụ Ndịàmà Jehova atọ aha ha bụ Paulos Eyasu, Negede Teklemariam, na Isaac Mogos, bụ́ ndị a tụrụ mkpọrọ kemgbe afọ 1994 n’ihi ihe ha kweere.
Mgbe nwoke a nọ n’ụlọ mkpọrọ, o ji anya ya hụ na Ndịàmà Jehova na-eme ihe ha na-akụzi. Ọ chọpụtara na ha na-eme ihe n’eziokwu, na-enyetụkwa ndị mkpọrọ ndị ọzọ nri ha. Ọ hụkwara otú ndị mkpọrọ ibe ya bụ́ Ndịàmà Jehova si amụkọ Baịbụl ọnụ kwa ụbọchị ma na-akpọ ndị ọzọ ka ha soro ha. Mgbe a gwara ha na a ga-atọhapụ ha ma ha bịanye aka n’akwụkwọ iji gosi na ha agaghịzi abụ Ndịàmà Jehova, ha jụrụ.
Ihe a apụghị nwoke a apụ n’obi. Mgbe ọ kwafetara Nọọwee, ọ chọrọ ịma ihe mere Ndịàmà Jehova ji nwee okwukwe siri ezigbo ike otú a. N’ihi ya, mgbe Ndịàmà Jehova bịara na nke ya, ọ malitere iso ha na-amụ Baịbụl ozugbo, malitekwa ịga ọmụmụ ihe.
Na Septemba 2018, e mere ya baptizim ya aghọọ Onyeàmà Jehova. Ugbu a, ọ na-eji ohere ọ bụla o nwere agakwuru ndị si Eritria na Sudan, na-agba ha ume ka ha na-amụ Baịbụl ma na-eme ka okwukwe ha sie ike.