Olee Otú Agbamakwụkwọ Ndịàmà Jehova Na-adị?
Agbamakwụkwọ Ndịàmà Jehova na-abụkarị ememme dị mfe, a haziri nke ọma. A na-ekwukarịkwa okwu dị nkenke si na Baịbụl. E nwekwara ike inwe oriri na ọṅụṅụ. a Jizọs gara ụdị oriri agbamakwụkwọ ahụ n’obodo Kena ná mmalite ozi ya n’ụwa.—Jọn 2:1-11.
Olee ihe ndị a na-eme n’agbamakwụkwọ ha?
Ihe bụ́ isi a na-eme n’agbamakwụkwọ Ndịàmà Jehova bụ okwu agbamakwụkwọ nke onye ozi Chineke, bụ́ Onyeàmà Jehova, na-ekwu. Okwu ahụ na-ewe ihe dị ka nkeji iri atọ. A ga-ekwu okwu ga-agba ume nke ga-enyere ndị ahụ chọrọ ịlụ aka ịhụ otú Baịbụl nwere ike isi nyere ha aka ịna-ahụ ibe ha n’anya, ịna-enwe obi ụtọ, nakwa inyere ha aka ka alụmdi na nwunye dịtee aka.—Ndị Efesọs 5:33.
N’ọtụtụ mba, gọọmenti na-ekwe ka ọ bụrụ onye ozi Chineke, bụ́ Onyeàmà Jehova, ga-ejikọ mmadụ abụọ chọrọ ịlụ. Ya bụrụ otú ahụ, e kwuchawa okwu agbamakwụkwọ ahụ si na Baịbụl, mmadụ abụọ ahụ chọrọ ịlụ ekwezie ibe ha nkwa. Ha nwedịrị ike inye ibe ha mgbaaka. Onye ahụ kwuru okwu agbamakwụkwọ ga-ekwuzi na ha abụrụla di na nwunye.
Ná mba ụfọdụ, iwu ha bụ na nwoke na nwaanyị chọrọ ịlụ ga-abịa n’ụlọ ọrụ gọọmenti ka a nọrọ ebe ahụ jikọọ ha. Ndị ahụ chọrọ ịlụ ga-eme ya obere oge tupu e kwuoro ha okwu agbamakwụkwọ. Ọ bụrụ na mmadụ abụọ ahụ ekweghị ibe ha nkwa mgbe ahụ ha gara n’ụlọ ọrụ gọọmenti, ha nwere ike ime ya ma e kwuchawa okwu agbamakwụkwọ ahụ. Ọ bụrụkwanụ na ha mere ya, ha nwere ike kwughachi ya ọzọ, ma ha ga-ekwu ya otú ga-egosi na ha ekwubuola ya. A ga-eji ekpere mechie agbamakwụkwọ ahụ ma rịọ Chineke ka ọ gọzie di na nwunye ahụ.
Ebee ka Ndịàmà Jehova na-anọ agba akwụkwọ?
Ọtụtụ Ndịàmà Jehova na-anọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze gbaa akwụkwọ. b Ọ bụrụ na ndị ahụ gbara akwụkwọ ga-achọ ka ndị mmadụ bịa kụọ ngaji n’ezé, ha ga-achọrọ ebe ọzọ a ga-anọ mee ya.
Ònye nwere ike ịbịa?
Ọ bụrụ na agbamakwụkwọ ahụ ga-abụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ma Ndịàmà Jehova ma ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova nwere ike ịbịa. Ya bụrụkwa na di na nwunye ahụ chọrọ ka ndị mmadụ bịa kụọ ngaji n’ezé, ọ bụ ha ga-ekpebi ndị ha ga-akpọ.
È nwere ụdị uwe a ga-achọ ka ndị ga-abịa yiri?
A gbawa akwụkwọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, e nweghị otu ụdị uwe a chọrọ ka mmadụ niile yiri. Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike ime ihe Baịbụl kwuru ma na-eyi uwe dị mma n’anya nakwa nke gosiri na ha na-akwanyere ihe a bịara ime ùgwù. Ọ na-atọkwa ha ụtọ ma ndị ọzọ bịara agbamakwụkwọ mee otú ahụ. (1 Timoti 2:9) Otu ihe ahụ ka a chọkwara ma ọ bụrụ na a ga-enwe oriri na ọṅụṅụ.
À na-enye onyinye?
Baịbụl gbara anyị ume ka anyị na-emesapụ aka. (Abụ Ọma 37:21) Ọ na-atọkwa Ndịàmà Jehova ụtọ inye ndị mmadụ ihe nakwa ma e nye ha onyinye n’agbamakwụkwọ ha. (Luk 6:38) Ma, Ndịàmà Jehova anaghị agwa ndị mmadụ nye ha onyinye, ma ọ bụkwanụ kpọọ aha ndị nyere onyinye. (Matiu 6:3, 4; 2 Ndị Kọrịnt 9:7; 1 Pita 3:8) Baịbụl kwuru na ụdị ihe ahụ adịghị mma. O nwekwara ike ime ka ihere mewe ndị bịara agbamakwụkwọ ahụ.
Hà na-eweli iko mmanya kụkọta ha ọnụ iji gọọ ọfọ ndụ na ahụ́ ike?
Mba. Ndịàmà Jehova anaghị agọ ọfọ, n’ihi na ịgọ ọfọ sitere n’okpukpe ụgha. c Ndịàmà Jehova na-esi n’ụzọ ndị ọzọ agwa ndị gbara akwụkwọ na ha chọrọ ka ihe dịrị ha ná mma, ọ bụghị ịkụkọta iko mmanya na-agọrọ ha ọfọ.
Ndị bịara agbamakwụkwọ hà ga-awụ ndị ahụ gbara akwụkwọ osikapa ma ọ bụ ụmụ irighiri ihe ndị ọzọ n’ahụ́?
Mba. N’ebe ụfọdụ, ndị mmadụ na-awụ ndị ahụ gbara akwụkwọ osikapa na ụmụ irighiri ihe ndị ọzọ n’ahụ́. Ha kweere na ọ ga-ewetara di na nwunye ahụ ihu ọma, obi ụtọ, na ogologo ndụ. Ma Ndịàmà Jehova anaghị eme ihe ọ bụla nwere ihe jikọrọ ya na ikwere ihe na-abụghị eziokwu. Nke a pụtara na ha anaghị agọ ọfọ ka ihu ọma kpọ mmadụ n’ihi na Baịbụl akwadoghị ime ya.—Aịzaya 65:11.
À ga-enye ndị mmadụ nri na mmanya?
A naghị anọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze eri ihe oriri ma ọ bụ ṅụọ mmanya ma a gbawa akwụkwọ ebe ahụ. Ụfọdụ ndị na-eme, ha gbachaa akwụkwọ, ha enwee nnọkọ, nye ndị mmadụ nri ma ọ bụ ihe e ji emegharị ọnụ. (Ekliziastis 9:7) Ọ bụrụ na ha ekpebie iweta mmanya na-aba n’anya, ha ga-eweta ya obere, hụkwa na ọ bụ naanị ndị toruru ịṅụ mmanya na-aba n’anya ka a ga-enye ya.—Luk 21:34; Ndị Rom 13:1, 13.
À ga-akụ egwú ma ọ bụ gbaa egwú?
Ọ bụrụ na ndị ahụ gbara akwụkwọ kpọrọ ndị mmadụ ka ha bịa oriri agbamakwụkwọ, ha nwere ike ịkụ egwú ma gbaakwa egwú. (Ekliziastis 3:4) Ụdị egwú a ga-akụ ga-abụ ụdị egwú na-amasị ha nakwa egwú na-atọ ndị ebe ha ụtọ, ma o kwesịrị ịbụ egwú dị mma, nke na-agaghị akpasukwa ndị bịaranụ iwe. A gbawa akwụkwọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, a na-akpọkarị egwú ndị isiokwu ha si n’Akwụkwọ Nsọ.
Ndịàmà Jehova hà na-eme ememme e ji echeta ụbọchị agbamakwụkwọ ha?
Baịbụl ekwughị na ọ dị mma ka a na-eme ememme e ji echeta ụbọchị agbamakwụkwọ, o kwughịkwanụ na ọ dị njọ ime ya. Ọ bụ di na nwunye ga-ekpebi ma hà ga-eme ya ma ọ bụ na ha agaghị eme ya. Ọ bụrụ na ha ekpebie ime ya, ha nwere ike ime ya naanị ha ma ọ bụkwanụ ha akpọọ ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha.
a Omenala obodo, otú ndị mmadụ si eme ihe, na ihe iwu obodo kwuru nwere ike ime ka otú e si eme agbamakwụkwọ n’otu ebe dị iche n’otú e si eme ya n’ebe ọzọ.
b A naghị akwụ onye ga-ekwu okwu agbamakwụkwọ ụgwọ ọ bụla, a naghị akwụkwa ụgwọ maka ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze gbaa akwụkwọ.
c Ị chọọ ịhụ ebe a kọwara otú o si bụrụ na iweli iko mmanya, kụkọta ya ọnụ iji gọọrọ mmadụ ọfọ ndụ na ahụ́ ike si n’omenala ndị na-ekpere arụsị, gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke gbara n’Ụlọ Nche Febụwarị 15, 2007.