Gaa n'Isiokwu

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Ji Ezi Ndị Chọọchị Ọzọ Ozi Ọma?

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Ji Ezi Ndị Chọọchị Ọzọ Ozi Ọma?

 Anyị achọpụtala na ọtụtụ ndị na-enwe mmasị ka anyị na ha kparịta ihe dị na Baịbụl n’agbanyeghị na ha nwere chọọchị ha na-aga. Anyị ma na onye ọ bụla nweere onwe ya ikwere ihe ọ bụla masịrị ya, anyị anaghịkwa amanye ndị mmadụ ka ha kweta ihe anyị gwara ha.

 Mgbe ọ bụla anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma, anyị na-agbalị ‘iji obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù dị ukwuu’ agwa ha okwu n’ihi na ọ bụ otú ahụ ka Baịbụl kwuru ka anyị na-eme. (1 Pita 3:15) Anyị ma na o nwere ndị na-agaghị achọ ịnụ ozi ọma anyị. (Matiu 10:14) Ma, anyị agaghịnụ ama onye ga-anụ na onye na-agaghị anụ ma ọ bụrụ na anyị agakwurughị ha zie ha ozi ọma. Anyị makwa na otú ihe si dịrị mmadụ taa nwere ike ọ gaghị abụ otú ọ ga-adịrị ya echi.

 Dị ka ihe atụ, o nwere ike mmadụ agaghị enwecha ohere mgbe anyị gara na nke ya, ma o ruo ụbọchị ọzọ, ya enwee ohere. Nsogbu nwekwara ike ịbịara mmadụ, ya emee ka onye ahụ nwewezie mmasị na Baịbụl. Ọ bụ ihe ndị a mere anyị ji aga na nke ndị mmadụ ọtụtụ ugboro ka anyị zie ha ozi ọma.