Gịnị Mere E Ji Kpagbuo Ndịàmà Jehova n’Oge Ndị Nazi Gbukpọrọ Ndị Mmadụ?
N’oge ndị ọchịchị Nazi gbukpọrọ ndị mmadụ, Ndịàmà Jehova bi na Jamanị na mba ndị ọzọ ndị Nazi na-achị dị ihe dị ka puku iri atọ na puku ise (35,000), ma ihe dị ka otu puku na narị ise (1,500) n’ime ha nwụrụ. Ọ bụghị ha niile ka a ma ihe kpatara ọnwụ ha. Ndị ọkachamara ka na-eme nchọchọ gbasara ya, ha nwekwara ike imecha kwuo ihe ọhụrụ ndị ha chọpụtara.
Olee otú ha si nwụọ?
E nwere ndị e gburu egbu: E gburu ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ narị Ndịàmà Jehova anọ (400) na Jamanị na mba ndị ọzọ ndị ọchịchị Nazi chịrị. A mara ọtụtụ n’ime ha ikpe ọnwụ n’ụlọikpe ma gbupụ ha isi. Ma, e nwekwara ndị nke a gbagburu agbagbu na ndị nke a kwụgburu akwụgbu n’ekpeghị ha ikpe.
Ụfọdụ nwụrụ ebe e jichiri ha, na-echi ha ọnụ n’ala: Ihe karịrị otu puku (1,000) Ndịàmà Jehova nwụrụ n’ogige ịta ahụhụ na n’ụlọ mkpọrọ ndị Nazi. E nwere ndị nwụrụ mgbe ha rụkatara ọrụ a manyere ha ịrụ, ike agwụ ha, nwee ndị nwụrụ mgbe a na-ata ha ahụhụ, nwee ndị agụụ gụgburu, ndị oyi tụgburu, ndị ọrịa gburu, na ndị nwụrụ n’ihi na e leghaara ọrịa ha anya. N’ihi otú e si chie ha ọnụ n’ala, ndị nke a tọhapụrụ mgbe Agha Ụwa nke Abụọ kwụsịrị mechakwara nwụọ.
Otú ndị ọzọ si nwụọ: E nwere ndị a kpọbara n’ụlọ a gbanyejuru gas, ha anọrọ ebe ahụ nwụọ, nweekwa ndị nke nwụrụ maka na e ji ha nwalee ọgwụ ụfọdụ ma ọ bụ otú ụfọdụ e nwere ike isi agwọ ọrịa. E nwekwara ndị a gbanyere ọgwụ ọjọọ n’ahụ́, ha anwụọ.[8]
Gịnị mere e ji kpagbuo ha?
A kpagburu Ndịàmà Jehova n’ihi na ha na-eme ihe Baịbụl kwuru. Mgbe ndị Nazi chọrọ ka Ndịàmà Jehova mee ihe Baịbụl na-akwadoghị, ha jụwara isi. Ha kpebiri na ha “ga-erubere Chineke isi karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29) Ka anyị leba anya n’ihe abụọ ha mere gosiri na ọ bụ ihe ha kpebiri.
Ha etinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ndịàmà Jehova nọ ebe niile n’ụwa taa anaghị etinye aka n’ihe ọ bụla gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ bụkwa ihe Ndịàmà Jehova bi n’ebe niile ndị ọchịchị Nazi chịrị mere. (Jọn 18:36) Ọ bụ ya mere na ha ekweghị
Aba amị ma ọ bụ rụọ ọrụ ọ bụla ọzọ na-akwado agha.—Aịzaya 2:4; Matiu 26:52.
Eso eme ntụliaka ọchịchị ma ọ bụ sonyere ọchịchị ndị Nazi.—Jọn 17:16.
Egbupụrụ swastika ma ọ bụ ọkọlọtọ ndị Nazi. Ha ekweghịkwa eto ndị ọchịchị, dị ka ịsị “Heil Hitler!”—Matiu 23:10; 1 Ndị Kọtint 10:14.
Ha na-ekpe okpukpe ha. N’agbanyeghị na a machiri Ndịàmà Jehova ịna-ekpe okpukpe ha, ha akwụsịghị
Ịna-ezukọ iji kpee ekpere ma fee Chineke.—Ndi Hibru 10:24, 25.
Ịna-agwa ndị mmadụ ihe Baịbụl kwuru na inye ndị mmadụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl.—Matiu 28:19, 20.
Imere ndị agbata obi ha ihe ọma, ma ndị Juu.—Mak 12:31.
Ikwere ihe ndị ha kweere, ha jụdịrị ịbịanye aka n’akwụkwọ iji gosi na ha abụghịzi Ndịàmà Jehova.—Mak 12:30.
Otu ọkachamara aha ya bụ Prọfesọ Robert Gerwarth kwuru na ọ bụ Ndịàmà Jehova “bụ naanị ndị e chiri ọnụ n’ala n’oge ahụ ndị Nazi na-achị Jamanị, naanị n’ihi okwukwe ha.” a Otú ha si kwụsie ike n’ihe ha kweere masịkwara ndị ọzọ na-abụghị Ndịàmà Jehova ha na ha nọ n’ogige ịta ahụhụ ahụ. Otu onye mkpọrọ bụ́ onye Ọstria kwuru, sị: “Ha anaghị aga agha. Ha na-ekweta ịnwụ, kama ha ga-aga gbuo onye ọzọ.”
Èbee ka ha nọ nwụọ?
N’ogige ịta ahụhụ: Ọ bụ n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche ka ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova nọ nwụọ. Ụfọdụ n’ime ogige ndị ahụ bụ Aụswich, Buken-wọd, Dakaụ, Flọsinbọọg, Mọtọsịn, Nuyingọme, Nidahagen, Ravensbrọk na Saksenhaụsen. A chọpụtara na ihe dị ka narị Ndịàmà Jehova abụọ (200) nwụrụ naanị na Saksenhaụsen.
N’ụlọ mkpọrọ: A tagidere ụfọdụ Ndịàmà Jehova ahụhụ ha anwụọ n’ụlọ mkpọrọ. E nwekwara ndị nwụrụ n’ihi ahụ́ e merụrụ ha mgbe a na-agba ha ajụjụ ọnụ.
Ebe a na-anọ egbu ndị mmadụ: Ebe a kacha nọrọ gbuo Ndịàmà Jehova bụ n’ụlọ mkpọrọ ndị dị na Belin-Plọtzinse, Brandenbọg na Hale/Saale. Ma, e dekwara n’akwụkwọ na e nwere ebe iri asaa ọzọ a nọ gbuo Ndịàmà Jehova.
Ụfọdụ n’ime ndị e gburu n’oge ahụ
Aha: Helene Gotthold
Ebe a nọ gbuo ya: Plọtzinse (Belin)
Helene bụ nwaanyị nọ na di ji ụmụ abụọ. A nwụchiri ya ọtụtụ ugboro. N’afọ 1937, n’ihi otú e si chie ya ọnụ n’ala mgbe a na-agba ya ajụjụ ọnụ, ime pụrụ ya. N’abalị asatọ n’ọnwa Disemba afọ 1944, e ji ígwè e ji egbupụ mmadụ isi gbupụ ya isi n’ụlọ mkpọrọ dị na Plọtzinse, Belin.
Aha: Gerhard Liebold
Ebe a nọ gbuo ya: Brandenbọg
N’abalị isii n’ọnwa Mee afọ 1943, e gbupụrụ Gerhard isi mgbe ọ dị afọ iri abụọ. Ihe a mere afọ abụọ e gbupụchara papa ya isi n’otu ụlọ mkpọrọ ahụ. N’ozi o zigaara ndị ezinụlọ ha na onye ọ chọrọ ịlụ tupu e gbuo ya, ọ gwara ha, sị: “A sị na Onyenwe anyị enyeghị m ike, agaraghị m emeli ihe a m mere.”
Aha: Rudolf Auschner
Ebe a nọ gbuo ya: Hale/Saale
Rudolf dị naanị afọ iri na asaa mgbe e gbupụrụ ya isi n’abalị iri abụọ na abụọ n’ọnwa Septemba afọ 1944. N’ozi o zigaara mama ya tupu e gbuo ya, o dere, sị: “Ọtụtụ ụmụnna anyị anwụọla n’ihi okwukwe ha, mụnwa ga-anwụkwa ka ha.”
a Akwụkwọ bụ́ Hitler’s Hangman: The Life of Heydrich, peeji nke 105.