Olee Otú Ndịàmà Jehova na Ndị Mmadụ Si Amụ Baịbụl?
Ndịàmà Jehova na-agwa ndị mmadụ ka ha na ha mụwa Baịbụl. Gị na ha mụwa Baịbụl, ọ ga-enyere gị aka:
Ịna-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ
Ịbụ enyi Chineke
Ịmata ihe Chineke kwere nkwa ime n’ọdịnihu
A zara ajụjụ ndị a na-esonụ ndị mmadụ na-ajụkarị gbasara otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl n’isiokwu a
Ugboro ole ka unu ga na-amụ ihe, nkeji ole ka unu ga-ejikwa na-amụ ya?
Ọ bụrụ na m kweta ka a mụwara m Baịbụl, ọ̀ pụtara na m ga-abụrịrị Onyeàmà Jehova?
M̀ nwere ike iji nsụgharị Baịbụl nke na-amasị m ma anyị na-amụ ihe?
M̀ nwere ike ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa soro anyị ma anyị mụwa Baịbụl?
Ọ bụrụkwanụ na e nweela mgbe mụ na Ndịàmà Jehova mụrụ Baịbụl, m̀ nwere ike ịmalite ya ọzọ?
M̀ nwere ike ịna-amụ Baịbụl n’onwe m n’enweghị onye ga-abịa ka mụ na ya na-amụ ya?
Olee otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl?
Mmadụ ga na-abịa ka gị na ya na-amụ Baịbụl. Onye ahụ ga-enyere gị aka ịghọta Baịbụl. Unu ga na-eme, unu muchaa otu isiokwu, unu agaa n’ọzọ. Unu ga-eji akwụkwọ bụ́ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi na-amụ ya. Akwụkwọ a ga-enyere gị aka ịmụta isi ihe Baịbụl na-ekwu nakwa otú ihe Baịbụl na-ekwu ga-esi nyere gị aka. Ị chọọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ, lee vidio a.
M̀ ga-akwụ ụgwọ tupu a mụwara m Baịbụl?
Mba. Ndịàmà Jehova na-eme ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya. Ọ sịrị: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.” (Matiu 10:8) Ị gaghịkwa akwụ ụgwọ maka ihe ndị i ji amụ Baịbụl. Ụfọdụ n’ime ha bụ Baịbụl na akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi.
Ugboro ole ka unu ga na-amụ ihe, nkeji ole ka unu ga-ejikwa na-amụ ya?
Akwụkwọ ahụ nwere isiokwu iri isii. Ma, ọ bụ gịnwa ga-ekpebi isi ole unu ga na-amụcha mgbe unu na-amụ ihe. Ma, ọtụtụ ndị a na-amụrụ Baịbụl na-ekpebi ịmụcha otu isi ma ọ bụ karịa kwa izu.
Olee otú m ga-esi malite?
1. Dejupụta fọm a dị na jw.org iji kwuo ka a bịa mụwara gị Baịbụl. Ihe anyị ga-eji ihe ndị i denyere ebe ahụ gbasara onwe gị mee bụ naanị ihe i ji maka ya denye ha, nke bụ́ ka Onyeàmà Jehova jiri ya chọta gị ka gị na ya mụwa Baịbụl.
2. Onye gị na ya ga na-amụ Baịbụl ga-achọ gị abịa. Ọ ga-agwa gị ihe ndị ị ga-atụwa anya ịmụta ka unu na-amụ Baịbụl, ọ ga-azakwa ajụjụ ọ bụla i nwere.
3. Gị na onye gị na ya na-amụ ihe ga-ahazi otú unu ga-esi na-amụ ya. Unu nwere ike na-amụ ihe ihu na ihu ma ọ bụkwanụ unu esi n’ekwentị na-amụ ya. Unu nwekwara ike iji akwụkwọ ozi ma ọ bụ ozi iimel. O nwere ike iwe unu ihe dị ka otu awa iji mụọ ihe. Ma, ọ bụghị iwu. O nwekwara ike ghara iru otu awa ma ọ bụkwanụ ya akarịa ya. Ọ bụ otú oge gị hà ga-ekpebi mgbe unu ga-anọru.
M̀ nwere ike ibu ụzọ lee otú ọ na-adị tupu mụ amalite?
Ee. Ọ bụrụ ihe ị chọrọ ime, biko dejupụta fọm a dị na jw.org. Ọ bụrụ na mmadụ abịa ka gị na ya mụwa Baịbụl, gwa onye ahụ na ị ga-achọ ibu ụzọ lee otú ọ na-adị tupu gị amalite ịmụ Baịbụl ka ị mara ma ọ̀ ga-amasị gị. Gị na ya ga-eji broshọ bụ́ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi mụọ ihe ka ị mara ma ọ̀ ga-amasị gị. Broshọ ahụ nwere isiokwu atọ.
Ọ bụrụ na m kweta ka a mụwara m Baịbụl, ọ̀ pụtara na m ga-abụrịrị Onyeàmà Jehova?
Mba. Obi na-atọ Ndịàmà Jehova ụtọ ha na ndị mmadụ ịna-amụ Baịbụl, ma, anyị anaghị amanye ndị anyị na ha na-amụ Baịbụl ka ha bụrụ Ndịàmà Jehova. Kama, anyị na ha na-amụ ihe Baịbụl kwuru, anyị ahapụzie ha ka ha jiri aka ha kpebie ihe ha ga-ekwere.—1 Pita 3:15.
M̀ nwere ike iji nsụgharị Baịbụl nke na-amasị m ma anyị na-amụ ihe?
Ee. I nwere ike ịna-eji nsụgharị Baịbụl ọ bụla dị gị mma. Ọ bụ eziokwu na ọ na-amasị anyị iji Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ amụrụ ndị mmadụ ihe n’ihi na a sụgharịrị ya nke ọma, ọ dịkwa mfe nghọta, ma, anyị ma na ọtụtụ ndị na-achọ ịna-agụ nsụgharị Baịbụl ndị masịrị ha, ndị ha dị mbụ agụ.
M̀ nwere ike ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa soro anyị ma anyị mụwa Baịbụl?
Ee. I nwere ike ịkpọ ndị ezinụlọ unu niile ma ọ bụkwanụ ndị enyi gị.
Ọ bụrụkwanụ na e nweela mgbe mụ na Ndịàmà Jehova mụrụ Baịbụl, m̀ nwere ike ịmalite ya ọzọ?
Ee. N’eziokwu, otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl ugbu a ga-atọ gị ezigbo ụtọ karịa ka ọ tọburu gị maka na a hazigharịala otú anyị si amụ Baịbụl ka ọ daba n’otú ihe si dịrị n’ụwa ugbu a. E nwekwuola ọtụtụ vidio ndị anyị ga na-ele ma anyị na-amụ ihe, nweekwa ihe ndị ọzọ anyị ga na-akọwa.
M̀ nwere ike ịna-amụ Baịbụl n’onwe m n’enweghị onye ga-abịa ka mụ na ya na-amụ ya?
Ee. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị na-achọ ka ha na mmadụ na-amụ Baịbụl, ma, ọ na-aka amasị ụfọdụ ka ha buru ụzọ na-amụtụ ya n’onwe ha. Anyị nwere ihe dị iche iche ga-enyere gị aka ịmụ Baịbụl n’onwe gị. O nweghị nke n’ime ha ị ga-akwụ ụgwọ nweta. Lee ihe ndị ahụ ga-enyere gị aka:
Vidio Ndị E Ji Amụ Baịbụl. Ha bụ obere vidio ndị na-akọwa ihe Baịbụl na-akụzi.
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara. Ha bụ isiokwu ndị na-aza ọtụtụ ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ gbasara ihe ndị dị na Baịbụl.
Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara. Chọpụta otú e si kọwaa ụfọdụ amaokwu Baịbụl ndị mmadụ ma nke ọma.