Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Ekwe Ka A Mịnye Ha Ọbara?
Ihe na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwukarị
Ihe ndị mmadụ na-ekwu: Ndịàmà Jehova anaghị aṅụ ọgwụ, ha anaghịkwa aga ụlọ ọgwụ.
Nke bụ́ eziokwu: Anyị na-achọ ka e si otú kacha mma e si agwọ ọrịa gwọọ anyị na ndị ezinụlọ anyị. Anyị rịawa ọrịa, anyị na-agakwuru ndị dọkịta ma nke a na-akọ n’ịgwọ ọrịa na n’ịwa ahụ́ n’ejighị ọbara. Obi dị anyị ụtọ na e nwekwuola ụzọ ndị ka mma e si agwọ ọrịa. E sizi otú e si agwọ Ndịàmà Jehova ọrịa n’ejighị ọbara agwọ ndị ọzọ. N’ọtụtụ mba, mmadụ nweziri ike ikpebi ka a ghara ịmịnye ya ọbara ka ọ ghara ibute ọrịa si n’ọbara onye ọzọ, ka ọbara ahụ ghara inyewe ya nsogbu n’ahụ́, nakwa ka a ghara imejọ ihe ma a mịnyewe ya ọbara.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu: Ndịàmà Jehova kweere na ọ bụ mmadụ inwe okwukwe ga-eme ka ọrịa ya laa.
Nke bụ́ eziokwu: Anyị ekwetaghị na ọ bụ okwukwe ga-eme ka ọrịa mmadụ laa.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu: Mmadụ ga-emefu ezigbo ego ma ọ bụrụ na o kweghị ka a mịnye ya ọbara.
Nke bụ́ eziokwu: Ịgwọ mmadụ ọrịa n’amịnyeghị ya ọbara anaghị efu nnukwu ego. a
Ihe ndị mmadụ na-ekwu: Ọtụtụ Ndịàmà Jehova na ụmụ ha na-anwụ kwa afọ n’ihi na ha ekweghị ka a mịnye ha ọbara.
Nke bụ́ eziokwu: E nweghị ihe gosiri na ihe a ndị mmadụ na-ekwu bụ eziokwu. Ọtụtụ oge, ndị dọkịta na-awa ndị mmadụ obi, na-awa ha ọkpụkpụ, na-etinyekwa ha akụkụ ahụ́ ndị ọzọ n’amịnyeghị ha ọbara. N’agbanyeghị na ụdị ịwa ahụ́ ndị a siri ike, ha na-awa ha n’ejighị ọbara. b Ndị toro eto na ụmụaka a na-amịnyeghị ọbara na-agbakekwa ka ndị nke a mịnyere ọbara ma ọ bụdị buru ha ụzọ gbakee. c Otu ihe doro anya bụ na e nweghị onye ga-ekwu hoo haa na mmadụ ga-anwụ ma ọ bụrụ na a mịnyeghị ya ọbara ma ọ bụkwanụ na onye a mịnyere ọbara ga-adị ndụ.
Gịnị mere Ndịàmà Jehova anaghị ekwe ka a mịnye ha ọbara?
Ọ bụ n’ihi ihe Baịbụl kwuru, ọ bụghị n’ihi ihe ndị ahụ́ ike kwuru. Ma Agba Ochie ma Agba Ọhụrụ kwuru hoo haa ka anyị zere ọbara. (Jenesis 9:4; Levitikọs 17:10; Diuterọnọmi 12:23; Ọrụ Ndịozi 15:28, 29) Chineke wekwaara ọbara ka ihe na-anọchi anya ndụ mmadụ. (Levitikọs 17:14) N’ihi ya, ihe mere anyị ji ezere ọbara abụghị naanị na anyị chọrọ ime ihe Chineke kwuru, kama, anyị na-akwanyekwara ya ùgwù n’ihi na ọ bụ ya na-enye ndụ.
Ndị mmadụ agbanwewala ihe ha cheburu
O nwere mgbe ndị ọrụ ahụ́ ike chere na mmadụ ikwu ka a gwọọ ya n’ejighị ọbara bụ ikwu ihe a na-anaghị eme eme, nakwa na onye kwuru otú ahụ na-achọ ihe ga-egbu ya. Ma, kemgbe afọ ole na ole ugbu a, ọ bụghịzi otú ahụ ka ndị mmadụ si were ya. Dị ka ihe atụ, n’afọ 2004, otu isiokwu gbara n’otu akwụkwọ ahụ́ ike kwuru na “ọtụtụ ụzọ e wepụtara isi na-agwọ Ndịàmà Jehova ọrịa ga-emecha bụrụ otú a ga na-esi agwọ mmadụ niile n’ọdịnihu.” d N’afọ 2010, isiokwu gbara n’akwụkwọ bụ́ Heart, Lung and Circulation kwuru na ‘ọ bụghị naanị Ndịàmà Jehova ka e kwesịrị “ịna-awa ahụ́ n’ejighị ọbara,” kama na e kwesịkwara isi otú ahụ na-awa mmadụ niile ahụ́.’
Ọtụtụ puku ndị dọkịta nọ n’ụwa niile anaghịzi amịnye ndị ha na-awa ahụ́ ọbara, kama, ha na-awa ha ahụ́ otú ọbara ga-agba ha na-agaghị ebu ibu. Ndị dọkịta nọ ná mba ndị ka na-emepe emepe na-esikwa otú a awa ndị mmadụ ahụ́ kama ịmịnye ha ọbara. Ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova na-ekwukwa ka e si otú ahụ waa ha ahụ́.
a Lee akwụkwọ bụ́ Transfusion and Apheresis Science, Volume 33, No. 3, p. 349.
b Lee akwụkwọ ndị a: The Journal of Thoracic and Cardiovascular Surgery, Volume 134, No. 2, pp. 287-288; Texas Heart Institute Journal, Volume 38, No. 5, p. 563; Basics of Blood Management, p. 2; na Continuing Education in Anaesthesia, Critical Care & Pain, Volume 4, No. 2, p. 39.
c Lee akwụkwọ bụ́ The Journal of Thoracic and Cardiovascular Surgery, Volume 89, No. 6, p. 918; na Heart, Lung and Circulation, Volume 19, p. 658.
d Continuing Education in Anaesthesia, Critical Care & Pain, Volume 4, No. 2, peeji nke 39.