Ndịàmà Jehova Hà Bụ Ndị Protestant?
Mba. Ndịàmà Jehova bụ Ndị Kraịst. Anyị abụghị ndị Protestant. N’ihi gịnị?
Ndị Protestant bụ “ndị okpukpe na-agba okpukpe Katọlik ụkwụ.” Ọ bụ eziokwu na anyị ekweghị n’ihe ndị Katọlik na-akụzi, ma e nwere ihe ụfọdụ mere anyị ji kwuo na anyị abụghị ndị Protestant. Ihe ndị ahụ bụ:
Ụfọdụ ihe ndị Protestant na-akụzi abụghị ihe Baịbụl na-akụzi. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na “e nwere otu Chineke,” ọ bụghị Atọ n’Ime Otu. (1 Timoti 2:5; Jọn 14:28) Baịbụl kwukwara hoo haa na ntaramahụhụ Chineke na-enye ndị ajọ omume bụ ịla ha n’iyi kpamkpam, ọ bụghị ịtụba ha n’ọkụ ala mmụọ.—Abụ Ọma 37:9; 2 Tesalonaịka 1:9.
Anyị anaghị agba okpukpe Katọlik ụkwụ ma ọ bụ na-achọ otú anyị ga-esi mee ka ha gbanwee ihe ha na-akụzi. Ihe anyị na-eme bụ ikwusara ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke, na inyere ha aka ikwere n’ozi ọma ahụ. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Mkpa anyị abụghị ime ka ndị okpukpe gbanwee ihe ha na-akụzi. Kama, mkpa anyị bụ ịkụziri ndị nwere mmasị eziokwu banyere Chineke na Okwu ya bụ́ Baịbụl.—Ndị Kọlọsi 1:9, 10; 2 Timoti 2:24, 25.