Olee Otú Ndịàmà Jehova Si Enweta Ego Ha Ji Arụ Ọrụ Ha?
Ebe kachanụ anyị si enweta ego anyị ji arụ ọrụ anyị na-arụ n’ụwa niile bụ n’onyinye Ndịàmà Jehova a na-enye. A na-edowe igbe i nwere ike itinye onyinye gị n’ebe ndị anyị na-anọ amụ ihe, e depụtakwara ụzọ ndị ọzọ i nwere ike isi nye onyinye gị na peeji ebe i nwere ike ịnọ nye onyinye. E nwere ụzọ dị iche iche onye chọrọ inye onyinye nwere ike isi nye onyinye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ anyị na-arụ, nakwa maka ego ndị a na-emefu n’ọgbakọ, ma ọ bụkwanụ maka ha abụọ.
O nweghị ego ole a na-atụ anya ka Onyeàmà Jehova ọ bụla na-enye, o nweghịkwa onye a na-asị weta otu ụzọ n’ụzọ iri. (2 Ndị Kọrịnt 9:7) Anyị anaghị ebugharị efere onyinye n’ọmụmụ ihe anyị ma ọ bụ sị mmadụ kwụọ ụgwọ tupu o soro n’ọmụmụ ihe anyị. Anyị anaghịkwa ana ego maka baptizim, olili ozu, agbamakwụkwọ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ. Anyị anaghị eme bazaa, ma ọ bụ ịgba chaa chaa ma ọ bụ ihe ndị yiri ya e ji achụ nta ego. Anyị anaghịkwanụ arịọ ndị mmadụ ka ha bịa nye onyinye. Anaghị akpọ aha onye nyere onyinye ma ọ bụ mee ka ọhaneze mara ndị nyere onyinye. (Matiu 6:2-4) Anyị anaghị esi n’ebe anyị na-agbasa ozi n’Ịntanet ma ọ bụ n’akwụkwọ anyị akpọsara ndị mmadụ ngwá ahịa ha ka ha nwee ike kwụọ anyị ụgwọ.
N’ọgbakọ Ndịàmà Jehova ọ bụla, a na-akọrọ ndị bịara ọmụmụ ihe otú ego ndị e nwetara n’ọgbakọ ha si gaa n’ọnwa ọ bụla. Onye ọ bụla nwere ike ịbịa ọmụmụ ihe ahụ. A na-elebakwa anya n’otú e si mefuo ego ndị e nyere n’onyinye mgbe mgbe ka e nwee ike hụ na e ji ego ndị a natara na-eme ihe otú kwesịrị ekwesị.—2 Ndị Kọrịnt 8:20, 21.
Ụzọ Ndị I Nwere Ike Isi Nye Onyinye
Igbe onyinye: I nwere ike itinye ego ma ọ bụ akwụkwọ e ji adọrọ ego n’igbe onyinye ndị dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị na n’Ụlọ Mgbakọ anyị ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ anyị na-anọ enwe ọmụmụ ihe.
Isi n’Ịntanet enye onyinye: N’ọtụtụ mba, i nwere ike isi n’adres Ịntanet anyị nye onyinye. Ebe ị ga-aga bụ n’ebe e dere “Donate to Jehovah’s Witnesses” ka i nye onyinye gị ebe ahụ. I nwere ike isi n’otu ụlọ akụ̀ wefee ego n’ụlọ akụ̀ ọzọ. I nwekwara ike iji kaadị ATM, ma ọ bụ si n’ụzọ ọ bụla ọzọ e si ezigara onye ọzọ ego. b Ụfọdụ Ndịàmà Jehova na-ekpebi inwe ego ha ‘wepụtara’ ha ga na-enye kwa ọnwa. Ha na-esi n’otu n’ime ụzọ ndị a e kwuru e si enye onyinye n’Ịntanet enye ya.—1 Ndị Kọrịnt 16:2.
Onyinye a na-ebu ụzọ haziere ihe ụfọdụ: E nwere ụdị ihe ọ ga-abụ ị chọọ inye, ya abụrụ na ị ga-ebugodị ụzọ hazie ihe ụfọdụ ma ọ bụdị ya adị mkpa ka ọkàiwu nye aka. Ụdị onyinye a nwere ike ime ka e sepụrụ gị ego n’ụtụ isi i kwesịrị ịkwụ n’obodo unu. Ọ baarala ọtụtụ ndị uru mgbe ha ghọtakwuru otú e nwere ike isi nye onyinye mgbe onye na-enye ya ka dị ndụ ma ọ bụ ndị nke onye ahụ kwuru ka e were ma ọ nwụọ. Biko jụọ alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị nso ebe i bi ma ọ bụrụ na ị chọrọ inye onyinye ndị gbasara:
ego e dowere n’ụlọ akụ̀
ịnshọransị na ego ezumike nká
ala na ụlọ
aka òkè na ihe ndị nọchiri anya ego
ike ékpé na ihe e nyere mmadụ ka o jide
Ị chọọ ịmatakwu ụzọ ndị ọzọ e nwere ike isi nye onyinye n’ebe i bi, gaa n’ebe e dere “Donate to Jehovah’s Witnesses.”
a Ụfọdụ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova na-enyekwa onyinye ha ji akwado ọrụ anyị.
b Kirie vidio Otú E Si Esi na Kọmputa ma Ọ Bụ n’Ekwentị Enye Onyinye ka ị ghọtakwuo otú e si eme ya.