Otú E Si Ese Foto Ndị E Ji Akọwa Ihe E Dere n’Akwụkwọ Anyị
Olee otú ndị na-ese foto ndị na-adị n’akwụkwọ anyị, bụ́ ndị na-akọwa ihe ndị e dere na ha, si ese ha? Iji mata otú ha si eme ya, ka anyị kọwaa ihe ndị e mere tupu e see foto gbara n’ihu Teta! Septemba afọ 2015 na otú e si see ya. a
Otú ọ ga-adị tupu e see ya. Mgbe ndị na-ese ihe na Ngalaba Na-ahụ Maka Ihe Ndị A Na-ese n’Akwụkwọ Anyị gụchara isiokwu Teta! bụ́ “Otú E Kwesịrị Isi Na-ele Ego Anya,” ha sere otú foto ndị ha chere ga-eme ka a ghọta isiokwu a ga-adị. Ngalaba a dị n’Ogige Ụlọ Akwụkwọ Watchtower dị na Patasịn, Niu Yọk. Ha wegaara Kọmitii Ide Ihe nke Òtù Na-achị Isi foto ndị ahụ ha sere. Ọ bụzi Kọmitii a họọrọ nke a ga-ese ga-agba n’ihu akwụkwọ a.
Ebe e sere ya. Ndị sere foto ndị ahụ anọghị n’ezigbo ụlọ akụ̀ see ha. Ha nọ n’ebe e doziri ka o yie ụlọ akụ̀ n’otu n’ime ebe a na-anọ echere ndị mmadụ n’Ogige Ụlọ Akwụkwọ Watchtower see ya. b
Ndị e sere na ya. Ndị niile e sere n’ihu Teta! ahụ bụ Ndịàmà Jehova. A họọrọ ha ka ha yie ndị ahịá nke otu ụlọ akụ̀ dị́ n’obodo mepere emepe. E deturu aha ha n’akwụkwọ ka ọ ghara ịbụ naanị ha ka foto ha ga na-agba n’akwụkwọ anyị.
Ihe Ndị E Sere na ya. Ngalaba Na-ahụ Maka Ihe Ndị A Na-ese n’Akwụkwọ Anyị gara weta ego ndị mba ọzọ ka o yie ka à nọ n’ụlọ akụ̀ dị́ n’obodo na-abụghị Amerịka. Ndị sere foto ahụ gbara mbọ mee ka ihe ndị e sere ebe ahụ yie otú ụlọ akụ̀ na-adị. Otu onye so ná ndị na-ese foto na-agba n’akwụkwọ anyị aha ya bụ Craig kwuru, sị: “E nweghị ihe e leghaara anya.”
Uwe ha yi na ihe ha ji chọọ onwe ha mma. Uwe niile ndị e sere n’ụlọ akụ̀ ahụ yi bụ nke ha. Ma, ọ bụrụ na ihe a chọrọ ise bụ ihe mere n’oge ochie ma ọ bụkwanụ ihe a chọrọ ka ndị a ga-ese na ya yiri uwe pụrụ iche, Ngalaba Na-ahụ Maka Ihe Ndị A Na-ese n’Akwụkwọ Anyị nwere ike ime nchọnchọ chọpụta ákwà kwesịrị ekwesị ha ga-eyi ma dụọ ya. Ndị bụ́ aka ochie n’ịchọ mmadụ mma na-achọ ndị foto ha ga-agba n’akwụkwọ anyị ahụ mma. A na-achọ ha mma ka ọ daba n’ihe a na-akọ akụkọ ya nakwa n’oge ihe ahụ a na-akọ akụkọ ya mere. Craig kwuru, sị: “N’ihi otú kamera ndị e nwere ugbu a si eseta ihe niile nke ọma nakwa n’ihi otú kọmputa ndị e nwere ugbu a si egosi foto nke ọma, anyị na-asa anya ná mmiri mgbe anyị na-ese foto ndị ahụ, n’ihi na anyị sejọọ ya, ya emebie.”
Ise foto. Ndị sere foto ahụ gbara n’ihu Teta! ahụ hụrụ na ọkụ ndị e ji see ya gosiri na mgbe e sere ya bụ n’ehihie. Na foto nke ọ bụla a na-ese, ndị na-ese ya na-ahụ na ụdị ọkụ ndị e ji see ya kwesịrị ekwesị. Nke a pụtara na a chọọ ise ihe mere n’oge anwụ na-acha, e jiri ọkụ ga-eme ka o yie ka anwụ ọ̀ na-acha see ya. A chọọkwanụ ise ihe mere n’oge ọnwa na-agba, e jirikwa ọkụ ga-eme ka o yie ka ọnwa ọ̀ na-agba see ya. Ọkụ ndị ahụ ga-adabakwa n’ụdị ihe a na-egosi na foto ahụ. Craig kwuru, sị: “Otú ọkụ dị na foto si acha dị ezigbo mkpa n’ihi na ọ bụ naanị otu foto ahụ ga-akọwa ihe niile gbasara ihe ahụ e sere. Ma, ọ dịghị otú ahụ na vidio.”
Imezi foto ndị e sere ese. E mechaa, ndị na-emezi foto ndị e sere ese mere ka a ghara ịma mba nwe ego ahụ gbara n’ihu Teta! ka ndị na-agụ ya lekwasị anya ná ndị e sere ebe ahụ kama ilekwasị anya ná mba ndị nwe ego ahụ. Ọ bụ eziokwu na ụzọ na windo ndị e sere na ya na-acha ọbara ọbara, a gbanwere ha ka ha chawa akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ. Nke a mere ka foto gbara n’ihu Teta! ahụ na ụcha ya bụrụ otu.
Ọ bụghị naanị na Patasịn ka a na-ese foto ndị na-agba n’akwụkwọ anyị. E nwekwara ndị na-ese foto n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị iche iche n’ụwa. E nwekwara ike ịgwa ha ka ha seta foto ndị ga-agba n’akwụkwọ anyị. Alaka ụlọ ọrụ ndị ahụ dị na Brazil, Ọstrelia, Kanada, Jamanị, Japan, Koria , Malawi, Meksiko, na Saụt Afrịka. N’ọnwa ọ bụla, Ngalaba Na-ahụ Maka Ihe Ndị A Na-ese n’Akwụkwọ Anyị na Patasịn na-enweta foto ruru ihe dị ka puku abụọ na narị ise ma dowe ha n’ebe ha na-edowe foto. Ọtụtụ n’ime ha na-agba n’Ụlọ Nche na Teta! A gụkọta Ụlọ Nche na Teta! e bipụtara kwa ọnwa n’afọ 2015, ha dị otu narị nde na nde iri na ise. Anyị na-akpọ gị ka ị bịa n’ogige anyị dị na Patasịn, dị́ na Niu Yọk, legharịa anya ma ọ bụkwanụ n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị iche iche ka i nwee ike ịmụtakwu banyere anyị.
a A na-ese ọtụtụ foto ndị na-agba n’ihu akwụkwọ anyị, ma ọ bụghị ha niile ka a na-ewere. Ma, a na-edowe ndị ahụ a na-ewereghị n’ebe a na-edebe foto. Ha na-emecha gbaa n’akwụkwọ anyị n’oge ndị ọzọ.
b Ọ bụrụ na a chọrọ ịnọ n’okporo ámá see foto ndị ahụ ga-agba n’akwụkwọ anyị, Ngalaba Na-ahụ Maka Ihe Ndị A Na-ese n’Akwụkwọ Anyị na-anatakarị ikike n’aka ndị ọchịchị. Ha na-agwa ndị ọchịchị mmadụ ole ha ga-ese, ụdị ngwá ọrụ ha ga-eji ese ha, nakwa ụdị ọkụ ndị ha ga-eji ese ha.