Ilegharị Anya n’Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova
Obi ga-adị anyị ụtọ ma ị gaa legharịa anya n’ụlọ ọrụ anyị dị iche iche nakwa n’ebe ndị anyị na-ebi akwụkwọ. Ebe a ka ị ga-anọ achọpụta ebe ụlọ ọrụ anyị dị na oge ndị ọbịa ji aga elegharị anya ebe ahụ.
Ịmaliteghachi Ilegharị Anya na Betel: N'ọtụtụ mba, a ga-amaliteghachi ịga legharịwa anya na Betel malite na Jun 1, 2023. Iji matakwuo ihe ndị ọzọ banyere ya, biko kpọturu alaka ụlọ ọrụ ị chọrọ ịga legharịa anya na ya. Biko, agakwala ilegharị anya na Betel ma ọ bụrụ na i bu ọrịa koronavaịrọs, nwee azụzụ, oyi ọmụma ma ọ bụ ya abụrụ na gị na onye bu ọrịa koronavaịrọs nọrọ ná nso nso a.
Amerịka
Maka Ịgwa Anyị Oge Ị Ga-achọ Ịbịa Legharịa Anya
Mmadụ ò kwesịrị ịgwa anyị mgbe ọ ga-achọ ịbịa legharịa anya? Ee. Iji hụ na ndị bịara ilegharị anya n’otu oge akarịghị akarị, anyị ga-achọ ka ndị ọ bụla ga-abịa ilegharị anya gwa anyị agwa tupu ha abịa n’agbanyeghị ole ha ga-adị.
Ọ bụrụ na ị gwaghị anyị agwa tupu gị abịa, ị̀ ka nwere ike ịga legharịa anya? O +nwere ike anyị agaghị ekwe ka ị gaa legharịa anya. Anyị enweghị ebe ga-aba ọtụtụ mmadụ, n’ihi ya, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ka anyị nwere ike ịkpọgharị n’ụbọchị.
Olee oge i kwesịrị irute n’ụbọchị ị chọrọ ịbịa legharịa anya? Iji hụ na ndị bịara ilegharị anya n’otu oge akarịghị akarị, biko abịala ihe karịrị otu awa tupu oge ị chọrọ iji malite ilegharị anya eruo.
Olee otú ị ga-esi agwa anyị na ị chọrọ ịbịa legharịa anya? Ọ bụrụ na unu agaghị eru iri abụọ, Pịa ebe e dere “Kwuo Oge Ị Ga-achọ Ịbịa Legharịa Anya—Maka Ndị Na-erughị Mmadụ Iri Abụọ.” Ma ọ bụghị ya, Pịa ebe e dere “Kwuo Oge Ị Ga-achọ Ịbịa Legharịa Anya—Maka Mmadụ Iri Abụọ ma ọ bụ Karịa.”
Ì nwere ike ịkagbu oge ị chọrọ ịbịa legharịa anya ma ọ bụ gbanwee ya? Ee. Pịa ebe e dere “Lee Oge I Tinyere ma ọ bụ Gbanwee Ya.”
Ọ bụrụkwanụ na mmadụ ole anyị chọrọ ịkpọgharị n’ụbọchị ị chọrọ ịbịa legharịa anya ezuola? Nọgide na-ele n’adres Ịntanet anyị n’ihi na anyị nwere ike ikwe ka ị bịa legharịa anya n’ụbọchị ahụ ma ọ bụrụ na ndị tinyeburu ụbọchị ahụ akagbuo ma ọ bụ yigharịa ya.
Adres Ya
Wọwik
1 Kings Dr.
TUXEDO PARK, NY 10987
UNITED STATES
+1 845-524-3000
Ihe A Na-eme
Ebe Mmadụ Ga-eji Aka Ya Legharịa Anya
Baịbụl na Aha Chineke. Ihe ị ga-ahụ ebe a bụ Baịbụl ọtụtụ mmadụ na-enweghị. Ị ga-ahụkwa otú e si chebe aha Chineke na Baịbụl n’agbanyeghị mbọ ndị mmadụ gbara iwepụ ya. Ihe ọzọ ị ga-ahụ ebe a bụ Baịbụl ndị ọzọ ọtụtụ mmadụ na-enweghị nakwa akwụkwọ na ihe ndị ọzọ aha Chineke gbara na ha. A ga na-agbanwe ha si n’oge ruo n’oge.
Ndị Jehova Kpọkwasịrị Aha Ya. N’ebe a, ị ga-ahụ foto dị iche iche nakwa ụfọdụ ihe ochie Ndịàmà Jehova jirila zie ozi ọma, gerekwa ihe ụmụnna anyị kwuru. Ihe ndị a na-egosi otú Jehova sirila na-eduzi ndị ya, na-akụziri ha ihe ma hazie ha ka ha na-eme uche ya.
Ọrụ Òtù Na-achị Isi Na-arụ. Ihe a na-egosi ebe a bụ ọrụ ngalaba dị iche iche nke Òtù Na-achị Isi na-arụ na otú ha si enyere ndị Jehova aka ịna-ezukọta ọnụ maka ife Chineke, ịna-ekwusa ozi ọma, ịna-amụ Okwu Chineke, nakwa ịna-ahụ ibe ha n’anya otú Akwụkwọ Nsọ kwuru ka ha na-eme.
Ebe A Ga-akpọgharị Ndị Mmadụ Ka Ha Legharịa Anya
Ihe ị ga-ahụ ebe a bụ Ọfis ụfọdụ nakwa gburugburu Wọwik.
Patasịn
100 Watchtower Dr. (2891 Route 22)
PATTERSON, NY 12563
UNITED STATES
+1 845-306-1000
Ihe A Na-eme
Ha na-ese foto ndị na-agba n’akwụkwọ anyị, na-emepụtakwa vidio na ihe ndị a na-egere egere. A na-akọwara ndị bịara ilegharị anya ụlọ akwụkwọ ndị e nwere n’ebe ahụ.
Wọlkil
900 Red Mills Rd.
WALLKILL, NY 12589
UNITED STATES
+1 845-744-6000
Ihe A Na-eme
Ha na-ebi ihe karịrị nde akwụkwọ iri abụọ na ise ndị e ji amụ Baịbụl kwa afọ. Ha na-ebugara alaka ụlọ ọrụ dị iche iche n’ụwa akwụkwọ n’ihe karịrị asụsụ narị atọ na iri isii. Ha na-ebugakwara ihe karịrị puku ọgbakọ iri na ise e nwere n’Amerịka, Kanada na Karịbian akwụkwọ.