Gaa n'Isiokwu

Ilegharị Anya n’Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova

Obi ga-adị anyị ụtọ ma ị gaa legharịa anya n’ụlọ ọrụ anyị dị iche iche nakwa n’ebe ndị anyị na-ebi akwụkwọ. Ebe a ka ị ga-anọ achọpụta ebe ụlọ ọrụ anyị dị na oge ndị ọbịa ji aga elegharị anya ebe ahụ.

Ịmaliteghachi Ilegharị Anya na Betel: N'ọtụtụ mba, a ga-amaliteghachi ịga legharịwa anya na Betel malite na Jun 1, 2023. Iji matakwuo ihe ndị ọzọ banyere ya, biko kpọturu alaka ụlọ ọrụ ị chọrọ ịga legharịa anya na ya. Biko, agakwala ilegharị anya na Betel ma ọ bụrụ na i bu ọrịa koronavaịrọs, nwee azụzụ, oyi ọmụma ma ọ bụ ya abụrụ na gị na onye bu ọrịa koronavaịrọs nọrọ ná nso nso a.

Angola

Maka Ịgwa Anyị Oge Ị Ga-achọ Ịbịa Legharịa Anya

Mmadụ ò kwesịrị ịgwa anyị mgbe ọ ga-achọ ịbịa legharịa anya? Ee. Iji hụ na ndị bịara ilegharị anya n’otu oge akarịghị akarị, anyị ga-achọ ka ndị ọ bụla ga-abịa ilegharị anya gwa anyị agwa tupu ha abịa n’agbanyeghị ole ha ga-adị. Ọ ga-adị mma ma unu gwa anyị ọ dịkarịa ala otu izu tupu oge unu ga-achọ ịbịa eruo. Ya bụrụ n’oge ezumike ka unu ga-achọ ịbịa, biko gwanụ anyị n’ezigbo oge.

Ọ bụrụ na ị gwaghị anyị agwa tupu gị abịa, ị̀ ka nwere ike ịga legharịa anya? O nwere ike anyị agaghị ekwe ka ị gaa legharịa anya. Anyị enweghị ebe ga-aba ọtụtụ mmadụ, n’ihi ya, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ka anyị nwere ike ịkpọgharị n’ụbọchị.

Olee oge i kwesịrị irute n’ụbọchị ị chọrọ ịbịa legharịa anya? Iji hụ na ndị bịara ilegharị anya n’otu oge akarịghị akarị, biko abịala ihe karịrị otu awa tupu oge ị chọrọ iji malite ilegharị anya eruo.

Olee otú ị ga-esi agwa anyị na ị chọrọ ịbịa legharịa anya? Ọ bụrụ na unu erughị mmadụ iri, “Pịa ebe e dere “Kwuo Oge Ị Ga-achọ Ịbịa Legharịa Anya​—Maka Ndị Na-erughị Mmadụ Iri.” Ma ọ bụghị ya, zitere anyị ozi iimel n’adres ndị a InboxBTHLTourDesk.AO@jw.org iji kwuo na unu ga-adị iri ma ọ bụ karịa.

Ì nwere ike ịkagbu oge ị chọrọ ịbịa legharịa anya ma ọ bụ gbanwee ya? Ee. Pịa ebe e dere “Lee Oge I Tinyere ma ọ bụ Gbanwee Ya.”

Ọ bụrụkwanụ na mmadụ ole anyị chọrọ ịkpọgharị n’ụbọchị ị chọrọ ịbịa legharịa anya ezuola? Nọgide na-ele n’adres Ịntanet anyị n’ihi na anyị nwere ike ikwe ka ị bịa legharịa anya n’ụbọchị ahụ ma ọ bụrụ na ndị tinyeburu ụbọchị ahụ akagbuo ma ọ bụ yigharịa ya..

Adres Ya

Avenida Talatona No. 1

LUANDA

ANGOLA

+244 923 166 760

E-mail: InboxBTHLTourDesk.AO@jw.org

Ihe A Na-eme

Ha na-asụgharị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ iri, ma Asụsụ Ndị Ogbi nke Angola. Ha na-ahụ maka ịrụ Ụlọ Nzukọ, na-ebugakwara ihe karịrị 2,567 ọgbakọ Ndịàmà Jehova e nwere n’Angola akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Baịbụl.

Danloduo akwụkwọ ga-akọkwuru gị ihe ndị ọzọ.