Gaa n'Isiokwu

Ilegharị Anya n’Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova

Obi ga-adị anyị ụtọ ma ị gaa legharịa anya n’ụlọ ọrụ anyị dị iche iche nakwa n’ebe ndị anyị na-ebi akwụkwọ. Ebe a ka ị ga-anọ achọpụta ebe ụlọ ọrụ anyị dị na oge ndị ọbịa ji aga elegharị anya ebe ahụ.

Ịmaliteghachi Ilegharị Anya na Betel: N'ọtụtụ mba, a ga-amaliteghachi ịga legharịwa anya na Betel malite na Jun 1, 2023. Iji matakwuo ihe ndị ọzọ banyere ya, biko kpọturu alaka ụlọ ọrụ ị chọrọ ịga legharịa anya na ya. Biko, agakwala ilegharị anya na Betel ma ọ bụrụ na i bu ọrịa koronavaịrọs, nwee azụzụ, oyi ọmụma ma ọ bụ ya abụrụ na gị na onye bu ọrịa koronavaịrọs nọrọ ná nso nso a.

Saụt Afrịka

Maka Ịgwa Anyị Oge Ị Ga-achọ Ịbịa Legharịa Anya

Mmadụ ò kwesịrị ịgwa anyị mgbe ọ ga-achọ ịbịa legharịa anya? Ee. Iji hụ na ndị bịara ilegharị anya n’otu oge akarịghị akarị, anyị ga-achọ ka ndị ọ bụla ga-abịa ilegharị anya gwa anyị agwa tupu ha abịa n’agbanyeghị ole ha ga-adị. Ọ ga-adị mma ma unu gwa anyị ọ dịkarịa ala otu izu tupu oge unu ga-achọ ịbịa. Ya bụrụ n’oge ezumike ka unu ga-achọ ịbịa, biko gwanụ anyị n’ezigbo oge.

Ọ bụrụ na ị gwaghị anyị agwa tupu gị abịa, ị̀ ka nwere ike ịga legharịa anya? O nwere ike anyị agaghị ekwe ka ị gaa legharịa anya. Anyị enweghị ebe ga-aba ọtụtụ mmadụ, n’ihi ya, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ka anyị nwere ike ịkpọgharị n’ụbọchị.

Olee oge i kwesịrị irute n’ụbọchị ị chọrọ ịbịa legharịa anya? Iji hụ na ndị bịara ilegharị anya n’otu oge akarịghị akarị, biko abịala ihe karịrị otu awa tupu oge ị chọrọ iji malite ilegharị anya eruo.

Olee otú ị ga-esi agwa anyị na ị chọrọ ịbịa legharịa anya? Pịa ebe e dere “Kwuo Oge Ị Ga-achọ Ịbịa Legharịa Anya.”

Ì nwere ike ịkagbu oge ị chọrọ ịbịa legharịa anya ma ọ bụ gbanwee ya? Ee. Pịa ebe e dere “Lee Oge I Tinyere ma ọ bụ Gbanwee Ya.”

Ọ bụrụkwanụ na mmadụ ole anyị chọrọ ịkpọgharị n’ụbọchị ị chọrọ ịbịa legharịa anya ezuola? Nọgide na-ele n’adres Ịntanet anyị n’ihi na anyị nwere ike ikwe ka ị bịa legharịa anya n’ụbọchị ahụ ma ọ bụrụ na ndị tinyeburu ụbọchị ahụ akagbuo ma ọ bụ yigharịa ya.

Adres Ya

1 Robert Broom Drive East

Rangeview

KRUGERSDORP

1739

SOUTH AFRICA

+27 11-761-1002

Iimel: InboxBTHLTours.ZA@jw.org

Ọfịs a na-anabata ndị ọbịa: A na-ebido ilegharị anya n’ọfịs a na-anabata ndị ọbịa bụ́ ebe a na-egosi ndị ọbịa vidio kọwara banyere Betel. Vidio ndị ị ga-ele ka ị na-elegharị anya ga-eme ka ị ghọta ihe ndị a na-arụ na Betel na otú ha si akwado ofufe anyị na-efe Chineke. Ụmụaka nwere ike ịnọ n’ebe e dowere foto Kelechi na Sọpụrụchi see foto n’ebe a na-ele vidio Bụrụ Enyi Jehova.

Ebe nke abụọ a na-elegharị anya n’ebe a na-ebi akwụkwọ: Vidio atọ ị ga-ele ebe a ga-akọwara gị uru ịsụgharị na ibipụta akwụkwọ anyị n’asụsụ dị iche iche na-aba. Ị ga-ahụkwa ebe ígwè ndị na-ebiri anyị akwụkwọ na-ebi akwụkwọ. Ihe kacha mkpa ị ga-ahụ ebe a bụ ebe a na-egosi ebe ndị e dere aha Chineke na Baịbụl ndị ochie e dere n’ụfọdụ asụsụ.

Ebe nke atọ a na-elegharị anya n’ebe a na-ebi akwụkwọ: N’ebe a, e nwere ebe ị ga-anọ hụ ngalaba na-ezipụ akwụkwọ. E nwekwara ihe a ga-eji egosi gị akwụkwọ ndị e biri ebi na ebe ndị a ga-ebuga ha. Vidio ato ị ga-ele ebe a ga-ekwu gbasara ngalaba na-arụ Ụlọ Nzụkọ Alaeze, ngalaba na-ezipụ akwụkwọ nakwa ebe a na-emepụta vidio na ihe ndị a na-egere egere.

Ebe Ndị Ọbịa Na-anọ Atụrụ Ndụ: Ebe a ka i nwere ike ịnọ rie nri i bu bịa. Ọ bụkwa n’ebe a ka ndị ọbịa ji bọs bịa na-adọwa ha. Ma n’oge ndị e nwere ezumike, a na-adọwa ụdị ụgbọala niile ebe a.

Ụgbọala ndị e ji ebu ndị bịara ilegharị anya: E nwere bọs ndị na-esi n’otu ebe a na-elegharị anya buru ndị mmadụ gaa n’ọzọ.

Ihe A Na-eme

Ha na-ebi akwụkwọ, magazin, broshọ, na traktị n’asụsụ karịrị otu narị na iri ise, na-ebugakwara ha ọtụtụ puku ọgbakọ ná mba iri abụọ. Ha na-asụgharịkwa Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl na vidio n’ihe karịrị asụsụ iri abụọ. Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ná Mpaghara Dị Iche Iche n’Ụwa nke dị n’alaka ụlọ ọrụ a na-ahụ maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ná mba iri anọ na abụọ dị ná mba Afrịka.

Danloduo Akwụkwọ Ga-akọkwuru Gị Ihe Ndị Ọzọ