Gaa n'Isiokwu

Ilegharị Anya n’Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova

Obi ga-adị anyị ụtọ ma ị gaa legharịa anya n’ụlọ ọrụ anyị dị iche iche nakwa n’ebe ndị anyị na-ebi akwụkwọ. Ebe a ka ị ga-anọ achọpụta ebe ụlọ ọrụ anyị dị na oge ndị ọbịa ji aga elegharị anya ebe ahụ.

Ịmaliteghachi Ilegharị Anya na Betel: N'ọtụtụ mba, a ga-amaliteghachi ịga legharịwa anya na Betel malite na Jun 1, 2023. Iji matakwuo ihe ndị ọzọ banyere ya, biko kpọturu alaka ụlọ ọrụ ị chọrọ ịga legharịa anya na ya. Biko, agakwala ilegharị anya na Betel ma ọ bụrụ na i bu ọrịa koronavaịrọs, nwee azụzụ, oyi ọmụma ma ọ bụ ya abụrụ na gị na onye bu ọrịa koronavaịrọs nọrọ ná nso nso a.

Slovakia

Maka Ịgwa Anyị Oge Ị Ga-achọ Ịbịa Legharịa Anya

Mmadụ ò kwesịrị ịgwa anyị mgbe ọ ga-achọ ịbịa legharịa anya? Ee. Iji hụ na ndị bịara ilegharị anya n’otu oge akarịghị akarị, anyị ga-achọ ka ndị ọ bụla ga-abịa ilegharị anya gwa anyị agwa tupu ha abịa n’agbanyeghị ole ha ga-adị. Ọ ga-adị mma ma unu gwa anyị ọ dịkarịa ala otu izu tupu oge unu ga-achọ ịbịa. Ya bụrụ n’oge ezumike ka unu ga-achọ ịbịa, biko gwanụ anyị n’ezigbo oge.

Ọ bụrụ na ị gwaghị anyị agwa tupu gị abịa, ị̀ ka nwere ike ịga legharịa anya? O nwere ike anyị agaghị ekwe ka ị gaa legharịa anya. Anyị enweghị ebe ga-aba ọtụtụ mmadụ, n’ihi ya, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ka anyị nwere ike ịkpọgharị n’ụbọchị.

Olee oge i kwesịrị irute n’ụbọchị ị chọrọ ịbịa legharịa anya? Iji hụ na ndị bịara ilegharị anya n’otu oge akarịghị akarị, biko bịa ọ dịkarịa ala nkeji iri tupu oge ị chọrọ iji malite ilegharị anya eruo.

Olee otú ị ga-esi agwa anyị na ị chọrọ ịbịa legharịa anya? Pịa ebe e dere “Kwuo Oge Ị Ga-achọ Ịbịa Legharịa Anya.”

Ì nwere ike ịkagbu oge ị chọrọ ịbịa legharịa anya ma ọ bụ gbanwee ya? Ee. Pịa ebe e dere “Lee Oge I Tinyere ma ọ bụ Gbanwee Ya.”

Ọ bụrụkwanụ na mmadụ ole anyị chọrọ ịkpọgharị n’ụbọchị ị chọrọ ịbịa legharịa anya ezuola? Nọgide na-ele n’adres Ịntanet anyị n’ihi na anyị nwere ike ikwe ka ị bịa legharịa anya n’ụbọchị ahụ ma ọ bụrụ na ndị tinyeburu ụbọchị ahụ akagbuo ma ọ bụ yigharịa ya..

Adres Ya

Pekna cesta 17

831 52 BRATISLAVA 34

SLOVAK REPUBLIC

+421 2-49107611

Ihe A Na-eme

Alaka ụlọ ọrụ a na-ahazi ọrụ ikwusa ozi ọma ihe karịrị puku iri abụọ na isii na narị ise Ndịàmà Jehova nọ na Chek Ripọblik na Slovakịa na-arụ. Na-asụgharịkwa akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ Chek, n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Chek, n’asụsụ Romani (nke a na-asụ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Slovakia), n’asụsụ Slovak na n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Slovakia.

Danloduo Akwụkwọ Ga-akọkwuru Gị Ihe Ndị Ọzọ