ABỤ NKE 135
Jehova Ji Obiọma Na-arịọ: “Mara Ihe, Nwa M”
-
1. Nw’okoro n’agbọghọ,
biko nyem obi gị
K’ihere mee Setan,
onye n’akwam emo.
Biko, jir’obi gị niile
jeerem ozi,
K’ụwa niile hụ na
ị n’adịrị mụn-dụ.
(UKWE)
Ezigbo nwam m hụrụ n’anya,
Mar’ihe, mee k’obim ṅụrịa.
Jir’obi gị dum jeerem ozi.
Nyem otuto si gị n’obi.
-
2. Jir’obiụ-tọ n’ọṅụ
nyem ihe gị niile.
A sịgodị n’ị daa,
m g’ekulite gị.
’Madụ ghọgbuo gị m’ọ bụ
mee k’ike gwụ gị,
N’echetam-gbe niile
nam hụrụ gị n’anya.
(UKWE)
Ezigbo nwam m hụrụ n’anya,
Mar’ihe, mee k’obim ṅụrịa.
Jir’obi gị dum jeerem ozi.
Nyem otuto si gị n’obi.
(Gụọkwa Diut. 6:5; Ekli. 11:9; Aịza. 41:13.)