ABỤ NKE 19
Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị
-
1. Nna, Jehova bi n’el’igwe,
Ihea bụa-balị kachan-sọ.
N’abalịa k’i mere kan-dị gị chọpụta
N’ị bụ Chineke dịe-bube.
Ha mer’Ememme Ngabiga.
I ji nw’atụrụ chebe ha.
Jizọs Kraịst mechara nyen-dụ ya mak’anyị.
O mezur’amụma i buru.
-
2. Jizọs fere gị ruo n’ọgwụgwụ.
Anyị g’agbalị ṅomie ya.
Achịcha nam-manya k’anyị ji n’echeta
Ihe gị na Nwa gị mere.
Biko, Jehova nar’ekele.
Anyị jia-balịa n’echeta
Na Nwa gị, Jizọs Kraịst,
chụr’àjà mak’anyị.
O ji ya mee k’anyị dịrịn-dụ.
-
3. Anyị zukọrọ k’anyị fee gị
N’ihi n’ọ bụ gị kpọr’anyị.
Ọ bụ gị, Jehova,
na Nwa gị, Jizọs Kraịst,
K’anyị niile ga n’ekele.
Biko, Jehova nar’otuto.
I mere k’anyị nwe’okwukwe.
Anyị ma n’ị g’eme k’anyị dum nwetan-dụ
M’anyị soro Nwa gị, Jizọs Kraịst.
(Gụọkwa Luk 22:14-20; 1 Kọr. 11:23-26.)