ABỤ NKE 48
Soro Jehova Na-eje Ije Kwa Ụbọchị
-
1. Jehova k’anyị ga n’eso,
Soro ya n’ej’ije kw’ụbọchị.
Ọ n’emeren-dị n’achọ ya
Amara n’ebere pụr’iche.
K’anyị bịakwute Jehova.
Ọ n’akpọ ’madụ niile.
Anyị niile ga n’efe ya.
Ọ bụ ya k’anyị g’akwado.
-
2. Iwe juru Setan n’obi
N’ihi n’ọ ma n’ọgwụgwụ dịn-so.
Ọ n’eme k’a n’akpagbua-nyị,
K’o mee k’anyị hapụ Jehova.
Ma, Jehova n’echeb’anyị.
Anyị ga n’anọ yan-so.
K’anyị fee ya ru’ebigh’ebi.
Naanị ya k’anyị g’akwado.
-
3. Jehova n’elekọt’anyị.
O nyer’anyị ’mụọn-sọ n’Okwu ya.
O jiọ-gbakọ ya n’edua-nyị.
Ọ n’az’anyị m’anyị kpọkuo ya.
K’anyị soro ya n’ej’ije.
Ọ ga n’enyer’anyịa-ka.
Ọ g’eme k’anyị rub’isi,
K’anyị n’ebin-dụ dị yam-ma.
(Gụọkwa Jen. 5:24; 6:9; 1 Eze 2:3, 4.)