ABỤ NKE 57
Anyị Na-ezi Ụdị Mmadụ Niile Ozi Ọma
-
1. Anyị niile g’eṅomi Chineke.
Anyị g’anabata ’madụ niile.
Ha soro ya, ọ g’azọpụta ha.
Ọ n’akpọ ha ka ha bịakwute ya.
(UKWE)
Eb’ọ bụla ’madụ si,
Ihe kam-kpa bụo-bi ya.
Anyị n’ezi ’madụ niil’oziọ-ma,
N’ezi ya n’ebe niile.
Anyị hụrụ ha n’anya.
Ha niile g’abụlie-nyi Jehova.
-
2. Ihe g’eme k’a zọpụta ’madụ
Bụ ma ya na Chineke dị nám-ma.
N’agbanyeghị obodo ’madụ si,
Ọ bụo-bi ya ka Jehova n’ele.
(UKWE)
Eb’ọ bụla ’madụ si,
Ihe kam-kpa bụo-bi ya.
Anyị n’ezi ’madụ niil’oziọ-ma,
N’ezi ya n’ebe niile.
Anyị hụrụ ha n’anya.
Ha niile g’abụlie-nyi Jehova.
-
3. Ndị niile gbalịrị chegharịa,
Jehova n’anabata ha niile.
Ọ bụ ya bụ ozia-nyị n’ezi ha.
Anyị n’ezi y’ụdị ’madụ niile.
(UKWE)
Eb’ọ bụla ’madụ si,
Ihe kam-kpa bụo-bi ya.
Anyị n’ezi ’madụ niil’oziọ-ma,
N’ezi ya n’ebe niile.
Anyị hụrụ ha n’anya.
Ha niile g’abụlie-nyi Jehova.
(Gụọkwa Jọn 12:32; Ọrụ 10:34; 1 Tim. 4:10; Taị. 2:11.)