ABỤ NKE 58
Anyị Na-achọ Ndị Udo
(Luk 10:6)
-
1. Jizọs gwar’anyị k’anyị ṅomie ya.
N’oge niile, n’ebe niile,
Ọ kụzir’okwu Jehova.
Ọ hụr’atụrụ Chineke n’anya.
Si n’ụtụtụ ruo n’abalị,
Ọ n’aga chọọ ha.
N’ụlọ n’ụlọ, n’okpor’ámá,
Anyị n’aga n’akọrọ ha
N’o ruwela kan-sogbu niile kwụsị.
(UKWE)
N’ụwa niile,
Anyị n’aga n’achọn-dị ’madụ
K’anyị chọta
Ndị chọrọ k’a zọpụta ha.
Anyị n’aga
N’ebe niile.
-
2. K’anyị gaa chọọ ha. Ọgwụgwụ dịn-so.
Anyị chọta naanịo-tuo-nye,
K’anyị gbalịa nyere y’aka.
Anyị n’achọ ha k’a zọpụta ha.
Anyị g’eji oziA-l’eze
n’akasi h’obi.
Anyị n’achọ n’ebe niile.
Anyị hụo-nye nwerem-masị,
Ọṅụ n’eme k’anyị gaa nyere y’aka.
(UKWE)
N’ụwa niile,
Anyị n’aga n’achọn-dị ’madụ
K’anyị chọta
Ndị chọrọ k’a zọpụta ha.
Anyị n’aga
N’ebe niile.
(Gụọkwa Aịza. 52:7; Mat. 28:19, 20; Luk 8:1; Rom 10:10.)