ABỤ NKE 64
Anyị Ji Ọṅụ Soro Na-ewe Ihe Ubi
-
1. Jehova kwere k’anyị soro
N’ejere y’ozi n’ubi ya.
Ihea kụrụ n’ubi achaala.
Anyị so n’ewekọta ya.
Onyenw’anyị k’anyị n’eṅomi.
Ọ bụ ya k’anyị ga n’eso.
Anyị n’enw’ọṅụ n’anyị so n’arụ
Ọrụ Chineke nyer’anyị.
-
2. Anyị hụrụ Jehova n’anya.
Ọ n’eme k’anyị n’agbam-bọ.
K’anyị n’agbalị n’oge niile
N’ihi n’ọgwụgw’ụwa dịn-so.
Jehova n’eme k’anyị nwe’ọṅụ.
Ọ bụn-gọzi si n’aka ya.
K’anyị jisi’ike rụọ ya ruo n’isi.
Jehova g’akwụa-nyị ụgwọ.
(Gụọkwa Mat. 24:13; 1 Kọr. 3:9; 2 Tim. 4:2.)