ABỤ NKE 65
Gaa n’Ihu
-
1. Gaa n’ihu, gaa n’ihu, gbalịa tozu’okè.
K’anyị gaa mee k’ụwa mụt’eziokwu Chineke.
Jisi’ike n’agbalị k’ozi gị kam-ma.
Jehova g’agọzi gị.
Oziọ-ma ka Jizọs kwusara.
Ọ bụọ-rụ Chineke nyer’anyị.
N’arịọ ya k’ọ n’eme k’i guzosi’ike,
N’emekwa ezio-mume.
-
2. Gaa n’ihu, gaa n’ihu, atụkwal’egwu.
N’ekwusa oziọ-ma ka ’madụ niile nụ ya.
Bịa soro n’ekwusa oziụ-lọ n’ụlọ.
Sor’anyị too Jehova.
Ekwela ka Setan merie gị.
Nọsi’ike n’ekwusa oziọ-ma.
N’ekwusa n’Al’eze Chineke dịn-so.
N’akụzi eziokwu ya.
-
3. Gaa n’ihu, gaa n’ihu, n’eletakwa ha.
N’agbam-bọ n’ozi gị. Ọrụ dịnụ bur’ibu.
Rub’isi ka ’mụọn-sọ Chineke duo gị.
Ọ g’eme k’ị n’enw’ọṅụ.
Ị hụn-dị chọr’ịnụ oziọ-ma,
Gaghachi kụziere h’eziokwu.
N’agbalị k’eziokwu bamie ha n’obi.
Mee ka ha mụt’eziokwu.
(Gụọkwa Fil. 1:27; 3:16; Hib. 10:39.)